Mwakpo abụọ mere n’Imo nakwa Ebonyi steeti na ngwụcha izu a

Ọwụwa anyawụ Naịjịrịa abụrụla ebe akụkọ mwakpo na-adazị gbowanyị gbowanyị, kwa izu ọbụla, okwu enweghị nchekwa bụ ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ.

Na ngwụcha izu a dịka izu ndị ọzọ akụkọ mwakpo abụọ esila n'akụkọ Imo nakwa Ebonyi steeti dapụta.

N'Imo steeti

Akụkọ si Imo steeti ekwuola etu ndị a ekperịma si wụbanyere ogige be nna Kọmịshọna ikpe n'Imo steeti ma gbaa ya ọkụ n'ụbọchị Satọdee.

Ọkaikpe Cyprain Okechukwu Charles onye a gbara be nna ya ọkụ ezipụtala ozi ma katọọ ihe mere ebe ahụ.

O zi ya dere:

"Akatọọla ọgbụgba ọkụ ndị omekome mere na be nna m kara nka"

"A tara m ahụhụ we jiri nwanyọ rụọrọ nna m ụlọ a mana taa ụlọ a nakwa nke ya onwe ya ji aka rụọ abụrụla ihe a gbara ọkụ"

O kwukwara na ihe a metụtara ezinụlọ ya nke ukwu dịka o kọwara na ndị a ji ụgbọala ukwuu bupụ ọtụtụ ihe n'ime ụlọ ahụ nke gụnyere ihe e ji amụ ọkụ latrịk, ihe eji ele ihe onyonyo nke Bekee na-akpọ TV, Igwe eji eme ka ihe jụọ onye nakwa ihe ndị ọzọ.

Ozi ya katọrọ ihe a sị ndị ojiegbe na-eme n'akụkụ Imo steeti dị ịcheịche nke ọ depụtara dịka: nchụpụ ndị uweojii n'obodo Orsu, ịtọ ndị mmadụ, inapụ ndi mmadụ ego n'ike nakwa na-egbu ma na-ata anụ ndị Igbo ibe ha.

Ọkaikpe Akaolisa kwupụtara: "Ihe mwute n'okwu bụ na ndị bụ ndị Igbo ibe m ma bụrụ ndị sị na ha na-alụ ọgụ mmwereonwe nye ndị Igbo".

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụ olu ndị uweojii nakwa kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ amịtaghị mkpụrụ dịka ha azaghị ozi e zitere ha.

N'Ebonyi Steeti

Kọmịshọna ndị uweojii n'Ebonyi steeti bụ Garba Aliyu agbala ama etu e si gbuo ndị mmadụ n'obodo Ohagelode Ishieke nke Ebonyi steeti n'ụbọchị Sọnde.

Akụkọ si obodo Ohagelode Ishieke nke Ebonyi steeti na ngwụcha izu a kọwara etu ndị omekome amaghị ndị ha bụ si wụba be otu nwoke mụnye be ya ọkụ ma gbuo nwunye ya na ụmụ ya.

Ka akụkọ a sị bịa, a na-enyo na ọ bụ ndị ekperịma na-akpa ike n'obodo Ezza na Effium nke okpuruọchịchị Ohaukwu bụ ihe mere ihe a.

Otu anya hụrụ ihe mere ebe ahụ kwuru na ihe mere n'isi ụtụtụ Sọnde.

Onye ahụ na-achọghị ka akpọ aha ya kwuru:

"Ndị wụbara be nwoke Izzi a, gbuo ndị niile bi ebe ahụ, nwunye ya, ụmụ ya ma gbuo ya dịka ha gbara be ya ọkụ"

a na-eche na mmadụ anọ nwụrụ na mwakpo a ugbua.

Cheta na ndị obodo abụọ bụ obodo Ezza na Effium nọ n'agha kemgbe afọ 2021.

Ndị uweojii steeti ahụ ekwuola na ha na-esi ime n'ala isipụta etu ya bụ ihe sị mee nakwa ihe nwereike ịkpata ya nụ mwakpo.

Akụkọ ka na-abịa.