You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ihe mere ụlọomeiwu Naịjirịa ji kpebie ịgbagha mkpebi ụlọikpe ụkwu nyere Abubakar Malami
Ụlọomeiwu Naịjirịa ekpebiela ịgbagha mkpebi Ụlọikpe Ụkwu nke Umuahia nyere ọkaiwu Ukwu Gọọmenti etiti bụ Abubakar Malami ikike ịkachapụ akụkụ nke iri asatọ na anọ, mpaghara nke iri na abụọ nke iwu ntuliaka ọhụrụ a kpọrọ 'Electoral Act 2022' n'ụlọikpe mkpegharị.
Akụkụ nke iri asatọ na anọ, mpaghara nke iri na abụọ nke iwu nkuliaka ọhụrụ kwuru sị:
"O nweghị onye ji ọkwa ọchịchị ga-eso tụọ vootu na ogogo ọbụla n'ọgbakọ ukwu nke otu pati ọbụla maka ịhaọpụta onye ga-az ọ ọkwa ọchịchị n'aha pati ọbụla."
Ndị omeiwu chọrọ ka Malami gbaa jim na mkpebi ụlọikpe rue ma e kpecha ya bụ ikpe. Cheta na Onyeisiala Muhammadu Buhari rịọburu ndị ụlọomeiwu ahụ ka ha kachapụ iwu ahụ mana ha jụrụ ajụ nke mere ka g a gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe
Onyeisiala mba South Africa akwụsịla ọtụtụ mmachị covid butere
Onyeisiala Cyril Ramaphosa na-achị mba South Africa ekwuola na ọtụtụ mmachị covid 19 butere ga-ebi taa bụ Wednesday March 23, 2022.
Ramophosa kwuru na kwuru na nyocha e mere na mba ahụ egosila na mmadụ si pasenti iri isii ruo pasenti iri asatọ enwetala mgbochi maka ọrịa covid.
O kwuru na nke a na mere gọọmenti mba ya ga-eji kwe ka ụfọdụ ụlọ ahịa mepee nakwa kwụsịtụ iyi mkpuchi imi.
Nkwụsị mmachị a ga-ahụ na emepekwara ọdọ egwuregwu , ebe nkiri , ụlọ egwuregwu ka ọha bata nke ga-eme ka ngalaba nlegharị anya chakeekwa ọzọ.
Mana ndị na-anọ ebe a na-eme mmemme ga-agba mbọ hụ na ha agbala ọgwụ mgbochi maọbụ gosi akụkwọ mpụtara nyocha ha mere maka covid ka awa 72 gafechara.
Ha ga-edowekwa ọnụọgugụ ndị ga-abịa mmemme ọbụla a na-eme na mba ahụ ugbua ruo pasenti iri ise (50%).
Ndị na-eme njem ga-egosiriri mpụtara nyocha ha mere maka covid dịka awa 72 gafechara ha ji bata mba South Afrika.
A ga-enwe akụụngwa e ji agba ọgwu mgbochi maka ndị mere njem chọrọ ịgba ya bụ ọgwụ ma ha batacha mba ahụ.
Kọmịshọna ndị Uweojii na Legos ekwuola na onye nara aka azụ ga-ata ahụhụ
Kọmishọna ndị uweojii na Legọs steeti bụ Abiodun Alabi adọọla ndị ọrụ ya aka na ntị gbasara iri ngarị maọbụ ịna akaazụ n'ụdị ọbụna.
Alabi kwuru nke a ụbọchị Tuzde mgbe ọ mere njem nleta n'isiụlọ ọrụ ha dị n'Ogba na Steeti ahụ ebe ọ sị na onye obula e jidere ga-ata ezigbo ahụhụ ọkachasi ugbua e tinyegoro ha ihe n'ego ụgwọ ọnwa ha.
Alabi gwara ndị uweojii na ha kaa onye uweojii ọbụla nara mmadụ aka azụ.
Ọ sị na ndị ngalaba ọrụ uweojii n'ahụ maka ọdịmma ndị uweojii agbaala mbọ ihe na tinyere ha ego mmachị akpa, bulikwaa ụgwọ ọnwa ha.
Ọ gwakwara ha sị "ọbụrụ na onye ụweojii ọbụla naa gị akaazụ maka ịgbapụta onye ahụ, gwaa ndị isi".
Ọ dọkwara ha aka na ntị ka ha kwusi ị na-ajụ ndị mmadụ akwụkwọ ụgbọala na-enweghị isi.
" Ịjụ ndị mmadụ akwụkwọ ha jiri bubata ụgbọala ha bụ ihe enweghị isi".
Ọ sịrị na ndị isi ha agwala ndị ọchịchị ka ha ghara ịsepụ ego n'ime ụgwọọnwa ha kwa mgbe kwa mgbe.
Ọ kwere nkwa na ya ga-ahụ na nsogbu ụfọdụ ha na-enwe.
Ndị omekome gburu mmadụ 34 na Kaduna
Ndị omekome egbuola mmadụ iri atọ na anọ (34) nke gụnyere ndị agha Naịjirịa mmadụ abụọ na mwakpo ha mere na Kaduna steeti ụbọchị ụka.
Ndị ajọọ mmadụ ahụ gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ n'obodo ahụ ma tinye ndị bi ebe ahụ n'oke ụjọ.
Akụkọ kwuru na ha kpara ya bụ mkpamkpa n'obodo anọ bụ ebe ha mebiri ọtụtụ ihe.