You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Muhammadu Buhari: O nweghi ihe dịka 'state police', wezụga ya n'ụsọ - Buhari
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ọchịchị ya agaghị atọhapụ Nnamdi Kanu dịka ụfọdụ na-arịọ ya, kama na ya ga-enye ohere ka ndị Ụlọikpe rụọ ọrụ ha.
O kwuru nke a mgbe ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere mkparịtaụka n'abalị ụbọchị Wenezde.
A nwụchiri Kanu na mba Kenya n'ọnwa June afọ 2021 ma kpụ ya n'ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu, ịkparị onyeisiala Buhari na ihe ndị ọzọ, ebe e jichiri ya mkpọrọ otu uweojii nzuzo bụ DSS kemgbe ahụ.
Ndị okenye Igbo gara na nsonso a rịọ onyeisial ka ọ tọhapụ ya nke Buhari saara ha na ya ga-eleba arịrịọ ha anya.
Mana na mkparịtaụka nke abalị a, Buhari kwuru na "Naanị otu ndị ka ọ dị n'aka , ya bụ ụlọikpe. Agaghị m etinye aka . Okwu a dị ha n'aka."
"Mgbe Nnamdi Kanu nọ n'ala Bekee, na-akpọrị m ma na-akpọrị Gọọmentị etiti, ọ chọghị ịzara ọnụ."
"Ugbua anyị na-enye ya ohere ka ọ kọwaa nakwa okwu ya."
"Anyị agaghị atọhapụ ya."
Maka 'restructuring'
Onyeisiala Buhari sị na ndị chọrọ 'restructuring' kweịrị ịkọwa ihe ha na-ekwu nke ọma. Ọ sị ka ha lee maapụ Naịjirịa anya, na kedụ ebe a ga-ebi na-eme ya bụ 'restructure'?
Ọ gaara n'ihu kwuo na ime ịhazigharị obodo ọ bụ n'isi onye?
Okwu 'state police'
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru ka , wezụga ya n'ụsọ, na o nweghi ihe ọbụla dịka inwe ndị uweojii nke steeti n'ọchịchị ya.
O kwuru nke a mgbe ya na ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV nwere mkparịtaụka n'abalị ụbọchị Wenezde.
Ọ sịrị na okwu ndakpọ nchekwa, na ọrụ ndị eze ọdịnala abụghị ihe a ga-eleghara anya n'ihi na ha ma onye bụ onye n'ogbe ha.
"Anyị kwesịrị ịlaghachi na ha iji gboo nsogbu nchekwa."
Buhari kwuru na Gọvanọ Oyo steeti na steeti ndị ọzọ nwere nsogbu a kwesịri inyocha ihe mere na ọdịmma dịbu n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo adịghịkwa ka ọ dị mbụ.
Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ kagbuo atụmatụ ndị uweojii steeti nke Bekee na-akpọ "State Police".
Nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo
"Ọ bụghị maka ma ọ bụ ọkọchị maọbụ udummiri (ka e ji nwee nsogbu a), ọ bụ maka ọnụọgụgụ ọha mmadụ nakwa okeala Naijiria."
"A gwara m ndị minista ọrụ ugbo ka okporo ịchị ehi ọkachasị n'Ugwu, onye ọbụla chịịrị ehi gafee ya ga-ata ahụhụ."
Anyị agbaala mbọ belata nsogbu ndị ọchị ehi na ndị na-akọ ugbo na Naịjirịa.
Ọkụ latrik
N'okwu ọkụ latrik, Buhari sịrị, "Obi adịghị m mma maka ọnọdụ ọkụ latrik."
"Ọ nweghị mba na-eto ma ha enweghị ewumewu na-akwalite akụnaụba dịka okporoụzọ, okporo oloko."
Akụnaụba na mmepe obodo
Buhari kwuru na ọ ga-aka mma ka ndị Naijiria malite mepụtawa ma kwadowa ihe ndị emepụtara na Naijiria.
O kwuru na ọ bụ naanị nke a ga-emepe obodo na mụbanwanye akụnaụba.
O kwukwara na atụmatụ mgbachi oke ala Naijịrịa na mba ndị ọzọ n'oge gara aga bụ ihe mere Naijiria ji malite mepụtawa ma resiwa mba ndị ọzọ osikapa n'uju.
Ịdọpụta ndị mmadụ n'aka ụbịam
O kwuru dịka ọtụtụ ndị mmadụ n'ala Naijịrịa bụ ndị ntoroọbịa na ịkọ ugbo na ịzụ anụmanụ bụ ụzọ ọ na-agba mbọ ịhụ na ha pụtara n'aka ụbịam.
Ọ gara n'ihu kwuo "Ala dị mkpa n'okwu ịkọ ugbo na ọzụzụ anụmanụ mana ndị Ndịdị Naijịrịa ka na-eme ndọrọndọrọ n'okwu ala.
I gaa n'Ugwu, ala niile bụ nke gọọmentị, enweghi onye na-azọ ya".
O kwuru na ihe na-echere atụmatụ a aka mgba ugbua bụ igwe (tractor) ndị e ji akọ ugbo nakwa tekịnụzụ e ji azụ anụmanụ nke Naijịrịa na-enweghi ugbua"
Ihe mere ibinye aka n'iwu ntuliaka ọhụrụ 'Electoral bill'
Onyeisiala Buhari kwuru na ọ gaghị ebinye aka n'iwu ọhụrụ maka ntuliaka.
Maka na atụmatụ pati ihọpụta naani otu onye ga-anọchiteanya ha site n'usoro ntuliaka ime ụlọ akpọrọ 'Primaries" na Bekee akwadoghi ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ka mma ka ndị pati wepụta mmadụ atọ ga-anọchite anya ha na ntuliaka na-agbanyeghi na nke a emeghi mgbe ọ zọrọ ọkwa Onyeisiala.
Na mpịachi, Buhari sị na ndị na-aṅụrị ọṅụ ugbua maka akwammiri Niger nke abụọ na-agbanyeghi na arụchabeghi ya.
Ọ sị na uche ya adịghị na ntuliaka afọ 2023 maọbụ onye ga-anọchi.
Buhari sị na ihe a ga-eji cheta ya bụ na ọ gbara mbọ belata mpụ, nrụrụaka na ohi akụnaụba n'ebe ọ dị ala nke ukwuu.