You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ramaphosa bụ osote Zuma na-akawado ịbụ onyeisiala South Africa
N'ozi o ziri nke a gbasara n'onyonyo televishon, Zuma kwuru na ya na-arịtu ozigbo.
E boro Zuma, onye banyere ọchịchị kemgbe afọ 2009, ọtụtụ ebubo mmerụaka.
Akwụkwọ ozi si n'aka ụlọọrụ gọọmenti kwuru n'ụlọ ọmeiwu ga-aahọ onye isiala ọhụrụ n'ehihie tọọsde.
Onye bụ Cyril Ramaphosa
- E tinyere ya n'ụlọ mkpọrọ n'afọ1974 na 1976 maka ibụ agha megide ịgbaoke agbụ
- Onyeisioche kọmiti kwadoro ntọpụ a tọpụrụ Nelson Mandela na mkpọrọ n'afọ 1990
- O nweburu olile anya na ọ ga-abanye n'ọchịcị mgbe Mandela rituru na 1999 mana a họrọ Thabo Mbeki
- Ọ nọ na Lonmin oge oke ogbugbu ndị mmadụ na Marikana n'afọ 2012
- O bụrụ osote onyeisiala mba South Africa n'afọ 2014
- E mere ya onye ndụ otu ANC ka e mechara ntuliaka n'afọ 2017
- Ọ bụrụ onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala n'ụbọchị ọnwa Februwarị, afọ 2018
- Dịka osote onyeisiala, Ramaphosa ka ọ dịlị ị bụ onye ga-na arụ ọrụ dịka onyeisiala, ozigbo Zuba rịdara n'ọchịchị.
Dịka ọnye ntaakụkọ BBC Milton Nkosi sịrị, ọtụtụ na-enwe olileanya na Ramaphosa ga-ewghachị akunaụba South Africa dịka mba ka mecharịcha emepe n' Africa, ebe ahụ Zuma na-eme ụfọdụ nihi na-o mere iwu ịkwụ oke ụgwọ akwụkwọ.
Zuma, onye bụbu onye otu agha ANC n'oge ịkpaoke agbụ rịrị n'okwa were bụrụ onyeisiala.
O duru obodo ahụ ihe karịrị otu n'ime ụzọ atọ oge kemgbe ha jiri pụta n'ikpaoke agbụ.