Gịnị bụ "Stay Execution of Judgement" high court nyere Dave Umahi?

Ọkaikpe Inyang Ekwo akụchapụla akwụkwọ Dave Umahi tinyere iji rịọ ka a hapụ ya n'ọkwa dịka Gọvanọ Ebonyi Steeti.

Cheta na ọkaikpe Ekwo nyeburu iwu n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị 2022, wee chutuo Dave Umahi na osote ya bụ Kelechi Igwe, n'ihi na ha hapụrụ pati PDP ebe ha nọrọ merie ọchịchị banye APC.

Mkpebi ahụ metụtakwara ndị Omeiwu Ebonyi steeti niile so Umahi pụọ na PDP banye APC.

N'oge ụlọikpe nyechara mkpebi a, ọkaiwu Umahi bụ Chukwuma Machukwu Umeh, rịọburu ọkaikpe Inyang Ekwo ka o nye ohere ka Umahi nọgide n'ọchịchị ruo oge ụlọikpe mkpesa ga-ekpebi ya bụ ikpe.

Mana taa bụ Mọnde, Maachị 21, ka ya bụ ọkaiwu Chukwuma Umeh gwakwara ọkaikpe Inyang Ekwo ka ọ wezụga ya bụ arịrịọ ha rịọbụrụ sị ya ka ọ hapụ ha n'ọchịchị.

Umeh rịoburu ụlọikpe ahụ arịrịọ ka ọ hapụ Dave Umahi na Osote ya bụ kelechi Igwe n'oche ọchịchị rụọ mgbe ụlọikpe mkpegharị kpebiri ikpe ha.

Ọ kọwara na ebe ọ bụ na ha agbaala akwụkwọ mkpesa n'ụlọikpe 'Appeal Court', ọ dịzighị mkpa ka ya bụ okwu na-aga n'ihu n'ụlọikpe 'High Court'.

N'ihi nke a, ọkaikpe Inyang Ekwo kụchapụrụ ya bụ ikpe.

Gịnị bụ "Stay Execution of Judgement"

Okaiwu Ikechukwu Nwabufo kọwara BBC Igbo ihe atụmatụ 'Stay Judgement of execution'.

O kwuru sị, ' Mgbe ọkaikpe kpebiri ikpe, onye e kpere ya bụ ikpe n'isi nwereike ị ga-tinye akwụkwọ n'ụlọikpe a ka ha kwụsị ime ihe ya bụ ikpe kpebiri'.

O kwukwara sị, 'Tupu ha ga-eme nkea, ha ga-aga n'ụlọikpe ka ebe e kpere ya bụ ikpe were tinye akwụkwọ mkpesa maka ikpe ụlịọkpe nke nta kpere ha'ụlọikpe nke kpere ya bụ ikpe.

Dịka Umahi gara n'ụlọikpe mkpesa were kpesa ikpe nke ụlọikpe elu kpere n'isi ya.

Nwabufo kọwara sị, "Atụmatụ a bụ ihe a na-akpọ 'Stay execution of Judgement' ".

Kama ọ rụtụrụ aka were sị, 'tupu emee mkpesa a, a ga-enwerịrị isiokwu siri ike ha ga-agbado ụkwụ were mee ya bụ mkpesa'.