Ebonyi state gọọvernment: 'Ọ bụghị Ebubeagụ wakporo ụlọ Abia Onyike'

Gọọmenti Ebonyi steeti ekwuola na ọ bụghị ha nke ọ na-abụghị otu Ebubeagu wakporo ụlọ Abia Onyike bụbu Komishọna mgbasaozi n'Abakaliki, Ebonyi steeti

Ndị bu egbe wakporo ụlọ Onyike dị n' Abakaliki n'ụzọ ụtụtụ Fraide ma wụọ mgbọ egbe ihe ruru nkeji iri atọ (30 minutes) .

Onyike bụ onye otu pati na anọghị n'ọchịchị bụ People's Democratic Party (PDP) na steeti ahụ,boro ndị otu nche ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwu bụ Ebubeagụ nke Dave Umahi hiwere na steeti ahụ ebubo na aka ha dị na ya.

Mana Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Uche Orji kwuru na ebubo Onyike na-ebo Gọvanọ Ụmahi bụ ụgha.

"Ndị Gọọmenti Ebonyi steeti anaghị eme otu ahụ. Anyị enweghị efe."

Ndị bu egbe wakporo ụlọ Abia Onyike

Dịka ndị nọ mgbe o mere siri kwuo, o nweghị onye nwụrụ maọbụ merụọ ahụ na mwakpo a mana mgbọ egbe kpọpuchara aja ma gbakaa ugegbe mpio ụlọ ahụ.

Onyike, onye kwuru na ya anọghị n'ụlọ mgbe ihe ahụ mere gara n'ihu sị, gwara BBC Igbo n'ekwentị na akụkọ ahụ bụ eziokwu.

"Ndị bu egbe bu ụgbọala Siena wakporo ụlọ m n'ebe elekere abụọ nke isi ụtụtụ, gbaa egbe ihe ruru nkeji iri atọ ebe ahụ."

"Gbakasịchaa ma windo, ma gbamgbam na ihe ndị ọzọ mana e kelre m Chineke na o nweghị onye mgbọ merụrụ ahụ.

"Mana mgbọ juru ebe niile ma na ala ma n'ime ụlọ m."

O boro ebubo sị, "Ọ bụ ndị Ebubeagu gbara egbe ahụ, ndị mmadụ hụrụ ha n'anya. Ha ji Siena bịa."

O kwuru na ya nwetara ozi mmaja dịka ya nwechara mkparịtaụka n'otu ụlọ ntaakụkọ ụbọchị Tọzde ebe ya kwuru na ya kwadoro nchutu a chuturu Dave Umahi dịka gọvanọ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ezinaụlọ ya ewegarala ndị uweojii mkpesa maka mkpamkpa ahụ kpara n'ogige DPS dị n' Ochido.

N' otu aka ahụ, otu Ebubeagụ gọrọ n'aka ha adịghị na mwakpo ahụ.

Panchris Ikechukwu bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nke Gọvanọ Umahi n'ihe gbasara nchekwa ma bụrụkwa onye na-achịkọta Ebubeagụ na steeti ahụ kwuru na ebubo ahụ bụ ụgha.

N'okwu ya ọ sị: "Ọ bụghị eziokwu, kedụ ka Ebubeagụ bụ ndị na-echekwa obodo ga-esi bụrụ ndị bịara agba ya egbe?"

"Ihe anyị na-eche bụ ihe ga-abara ọha ndị Ebonyi uru."

Ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC Igbo na ha amaghị maka mwakpo ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Loveth Odah kwuru n'ekwentị, na ọ nweghị onye wetara ha mkpesa ọbụla banyere mwakpoo ahụ.

"E nweela onye kpọrọ m jụọ m maka ya bụ ihe, mana ajụọla ndị ọrụ m, e nweghị ndị wetara mkpesa ọbụla maka ya."

Odah gara n'ihu nye ndụmọdụ sị: "Gwa ya (Abia Onyike) ka ọ ga nye mkpesa n'ogige ndị uweojii."

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị uweojii ga-eme nnyocha ịmata ihe mere ma o mee nke a.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: