You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Fr James Anelu reinstated: A kpọghachịtala ụkọchukwu a eboro ebubo ịkwụsị egwu Igbo n'ụlọụka ya
Archbishop Adewale Martins bụ onyeisi ụka Katọlik na Legọs steeti enyeghachịla Fada James Anelu - onye e boro ebubo imachi ikwe ukwe Igbo n'ụlọụka ya - ikike ido 'mass'.
Mkpọghachite ya bịara dịka Archbishọp Adewale kwụsịtụrụ ya ọrụ nwa mgbe nta site n'ụbọchị asaa nke ọnwa Febrụwarị 2022.
N'ozi o si n'aka Rev. Fr. Anthony Godonu gbasaa, Archbishọp Martins kwuru na ha mechara nnyocha ma chọpụta na etu e si kọọ akụkọ maka nkwụsị ọ kwụsịrị egwu Igbo n'ụlọụka ya na soshal midia, abụchaghị etu ya bụ ihe si mee.
Archbishọp Martins gara n'ihu gwa Fada Anelu ka ọ lọghachite n'ụlọụka ya iji mezie ihe akụkọ ahụ wuru na soshal midia mebiri, ma weghachite udo n'ụlọụka ahụ.
Lee ihe o kwuru n'akụkwọ ozi ahụ:
Fada Anelu asaala ebubo na ọ machiri ịgụ egwu Igbo n'ụlọụka Katọlik
Fada James Anelu ekwuola okwu banyere ebubo e boro ya na ọ kwụsịrị ndị mmadụ ịgụ egwu ndị Igbo n'ụlọụka Katọlik nke Ikorodu dayọsis dị na Legọs.
Oge BBC Igbo kpọrọ Fada Anelu, o kwuru na ya enweghị ihe ọbụla ọ ga-ekwu n'ihi na onyeisi ya bụ Bishọp ekwuolarịị okwu gbasara ya.
O kwuru na ọ bụchaghị etu ndị mmadụ sị akọ ya bụ akụkọ na soshal midia ka o si dị n'ezie.
Akụkọ banyere ebubo na Fada a machiri ikwe ukwe Igbo n'ụlọụka ya wuru n'ụtụtụ Tuzde 8 Febụwarịm 2022.
O butere ọtụtụ okwu nakwa nghọtaghie nke mere ụfọdụ ndị ụkọchukwu Kalolik jiri tinye ọnụ na ya.
Otu ụkọchukwu sị na onweghị onye nwere ikike ịmachi asụsụ ọbụla n'ụlọụka.
N'ihi otu okwu ahụ, onyeisi ụka Katọlik na Legọs bụ Archbishop Adewale Martins kwụsịrị Fada Anelu ịka ụka nwa mgbe nta.
Fada Anelu bụ ụkọchukwu na-elekọta ụlọụka Holy Trinity Catholic Church, nke dị na mpaghara Ewu-Owa Gberigbe, Ikorodu, Legọs steeti.
BBC kpọtụụrụ otu ụkọchukwu nyere aha ya dịka Fada Jude, onye kọwara na o nwereike ịbụ nghọtahie ka ndị mmadụ ghọtahiere ihe Fada James Anelu kwuru.
Fada Jude kwuru sị: "Onweghị mgbe Fada James ga-amachi ukwe Igbo n'ụlọụka ya. O nweghị onye nwere ikike ịmachi asụsụ ọbụla."
"Eji m n'aka ka na ihe ọ chọrọ ịkọwa bụ ka e nwee mmụọ nnabata, ghara ị na-ekwe ukwe e dere naanị n'otu asụsụ oge niile," Fada Jude kwuru.
Fada Jude kwuru na ya na-arụ ọrụ na Benin, mana ya ma Fada James Anelu nke ọma, "ọ bụghị onye na-akpa oke agbụrụ n'ụdị ọbụla".
O kwuru na ọ dị mma etu Bishọp si kwuo na ya ga-enyocha okwu ahụ iji chọpụta nke bụ eziokwu.
Cheta na akụkọ kwuru na Fada James Anelu mara ọkwa n'ụlọụka ya n'ụbọchị Sọnde, abalị isii nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022, ma kwuo ka akwụsị ikwe ukwe Igbo ọbụla n'ụlọụka ya.
Dịka ya bụ akụkọ si kwuo, ụkọchukwu Anelu kwuru na ya agaghị agbachị nkịtị ka ndị Igbo weghara ọnọdụ n'ụlọụka ya dịka ha si eme ebe niile ha gara.
Mana Bishọp Adewale Martins wepụtara akwụkwọ ozi n'ụbọchị Mọnde, abalị asaa nke ọnwa Febrụwarị 2022 iji katọọ Fada Anelu n'okwu ahụ o kwuru.
Bishọp kwuru na ihe Fada Anelu kwuru adabaghị adaba na nkuzi ụka Katọlik.
O kwuru sị: "Ụka Katọlik na-anabata onye ọbụla dịka otu ụmụnne n'agbanyeghị ebe onye si maọbụ okpukperechi onye."
Archbishop Martins kwuru na ya akwụsịla Fada Anelu ọrụ malite n'ụbọchị Tuesday, abalị asatọ nke ọnwa Febrụwarị 2022.
Ọ rịọkwara ndị ụlọụka ahụ ka ha jisi okwukwe ha ike ma gaa n'ihu ife Chukwu etu ha si emebu.
"Jikọtanụ ọnụ n'ịhụnanya, ụnụ ekwela ka asụsụ maọbụ ọdịnala maọbụ agbụrụ kewaa ụnụ," Archbishop Martins kwuru.
Ihe ndị mmadụ kwuru banyere okwu a
Otu onye a chọghị ka anyị kpọọ aha ya kwuru na Fada Anelu emebuola ụdị ihe a oge ọ nọ n'ụlọụka Katọlik dị n'Iba, Legọs steeti.
Onye ahụ kwuru na Fada Anelu na-ekwu ikwe naanị ukwe Igbo na-eme ka ndị ọzọ abụghị ndị Igbo ghara isonye nke ọma n'ụka.
Mana onye ahụ, bụkwa onye Igbo n'onwe ya, kwuru na ya echeghị na ọ bụ ịkpa oke ka ụkọchukwu ahụ na-akpasa ndị Igbo.
"N'uche nke m, ọ bụ iji mee ka ndị na-abụghị ndị Igbo na-aghọta ma na-esonye n'ukwe a na-ekwe n'ụlọụka," onye ahụ gwara BBC Igbo.
Onye bụ Fada James Anelu?
Dịka ọbaozi ndị ụka Katolik na Legọs steeti si gosi, Fada James Anelu bụ onye Auchi dị n'Edo steeti.
E chiri ya ụkọchukwu n'ụka Katọlik n'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọkutoba afọ 2001.
Nke a pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu afọ iri abụọ na otu.