Bishop Godfrey Onah: 'ỤmụIgbo, unu emezila ka ọnụ a kọrọ unu maka na ọnọdụ ugo adịghị egbe mma'

Bishopu Godfrey Onah na-elekota dayosis Nsuka n'uka Katọlik akatọọla ogbugbu dị iche iche na-eme n'ala Igbo nso nso a.

Onah kwuru na ya bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkakwụ adịghị mma, ma kpọọ oku ka ewu na ọkụkọ tinye uche ma kpaa nkata gbasara ya.

Ọ dọkwara aka na ntị kwuo ka ndị bi n'ofesi kwụsị ịnọ ebe ihe na-aga nke ọma ma na-amunye ọkụ n'ụlọ makana o nweghị onye ma onye ọkụ ga-agba.

O kwukwara na a ga-eburu ụzọ mara ihe na-eme na Naịjiria na-adịghị mma tupu e kwube okwu nkewa, ka a ghara iburu nsogbu ahụ banye n'ebe nke ọhụrụ.

O kwukwara na ọ ga-adị mma imezi ihe na-emebi na Naịjiria tupu e kwuwe okwu nkewa.

Kirie onyonyo a n'uju: