You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Father Ejike Mbaka ekwuola na Naiịjirịa ga-aka Afghanistan njọ ma akpachaghị anya
Onyeisi ụlọụka Adoration Ministry Enugu bụ Father Ejike Mbaka akatọọla mwakpo e mere n'ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa dị na Kaduna Steetị n'izuụka gara aga.
O kwuru nke a mgbe ọ na-agbasa ozi n'ofufe ya n'ụlọụka n'izu gara aga.
Ọ sị na nke a bụ mmalite ezigbote ọgbaghara na Naịjirịa dịka o si dọọ aka na ntị n'oge mbụ.
Ọ sị na kamgbe gọọmentị Naịjiria nwuchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu na-achọ nnwereonwe, Indigenous People of Biafra (Ipob) na mwakpo akwụsibeghi.
Fada Mbaka gara n'ihu jụọ "ugbua ọ bụ Nnamdi Kanu wakporo ụlọọrụ Nigerian Defence Academy"?
"Ọ bụ na ọ kaghị mma na a tọhapụrụ ya ebe ọ bụ na a wakporo ụlọọrụ NDA mgbe Kanu ka nọ n'aka ndị Naịjirịa?"
Fada Mbaka sị "kedụ ebe olileanya Naịjirịa dị ugbua? Ebe ụdị ihe a nwereike ime n'ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa, kedụzie ebe ọzọ nchekwa dị"?
Ọ sị na ebe ndị a banyenwuru n'ụlọọrụ ndịagha, na kedụzie ihe ọ ga-ewe ha ịbanye n'ụlọụka nakwa obi ọchịchị gọọmentị.
Ọ sị na ihe ọ na-arịọ Chineke bụ ka ọ gbata ọsọ enyemaka maka na ihe mere n'Afghanistan ga-aka njọ na nke ga-eme Naịjirịa n'ọdịnihu.
Ọ sị na ọ bụ ọrụ mmụọ nsọ ziri ya ka ọ na-arụ na ọ chọghị ịma maka nkatọ ndị mmadụ na-enye ya.
Ọ gaara n'ihu kwuo na a na-awakpo ya maka na ọ sịrị ka a tọhapụ onye a nwuchiri anwuchi.
Mbaka kpọrọ oku ka ndị ụkọchukwu ndị ọzọ gbalịa na-ekwu okwu maka ihe ọjọ na-eme n'obodo dịka ọ dị n'oge onye amụma Elijah.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: