Igbo Traditional musical instruments: Etu m si mụta ịkpọ ụbọ aka - Oluomachukwu Odimegwu
Ụbọ aka bụ otu n'ime ngwa egwu ndị Igbo e kwuru na-alazị ala n'ihi enweghi ọtụtụ ndị ma akpọ ya ọfụma.
Mana Oluomachi Odimegwu, nwatakịrị dị naanị afọ 15, ma etu e si akpọ ya ka ọ tọba gị n'ụmị.
Odimegwu bụ onye Ihiala dị n'Anambra steeti, gwara BBC Igbo etu o si mụta ịkpọ ya bụ ụbọ aka nakwa etu ịkpọ ya si enyere ya aka ịghọta omenala Igbo ọfụma.
Ọ gara n'ihu kwuo etu o si dị oke mkpa na ndị ọgbọ ya na ndị ntorobịa mụtara etu e si akpọ maọbụ akụ ngwa egwu Igbo ndị ọzọ e nwere.
Odimegwu jikwa ohere a foo akụkọ ifo nke o ji ịkpọ ụbọaka ya kwado.
Nwanne ya nwaanyị na-afụkwa ọja sonyekwara ya.
Ngwa kirie ya ka ihu bụrụ gị sọsọ ọchị.



