"Na mmụọ ka agwara m ga kụwa ufie, ngwa egwu Igbo a na-akụrụ ndị Eze"

Aha onyonyo, "Na mmụọ ka agwara m ga kụwa ufie, ngwa egwu Igbo a na-akụrụ ndị Eze"

Ufie bụ Ikoro pụruiche a na-akụkarị na Mbaukwu, Anambra steeti.

Ihe ngwaegwu a ji pụọ iche bụ na ikoro ndị ọzọ na-adịna ala mana Ufie na-akwụ ọtọ.

Mazi Sylvester Ifeanyichukwu Agu bụ onye e ji Eze Ufie n'Igbo niile were mara sị na ọ bụ mmụọ kuziere ya ịkụ ya bụ ngwaegwu.

O sị na ya malitere ịkụ ya bụ Ikoro n'afọ 1991.

Ọ sị na "Ufie bụ egwu ndị Eze na ndị Chiri echichi. Ndị nze na ọzọ".

Ọ sị na ya bụ ngwaegwu na-alazị ala maka na "e rukwaghị mmadụ ise n'akụ ya n'ala Igbo".

Mazị Agu ji Ufie ekwu okwu dị iche iche.

Ọ na-atụkwa ya bu ekwe bụ nke o ji Oke osisi ngwu atụ.

Ọ sị na Ngwụ bụ oke osisi n'ala Igbo nke pụtara na onye ji ya atụ ya bụ ekwa na-akpachapụ anya ya.

Ịkpachapụ anya abụghị naanị maka ịba onye ahụ n'anya maka okpukpo ọ na-ekpo, ka ma na onye ahụ kwesiri ịdowe onwe ya asọ.

Ọ sị na nwaanyị anaghị atụ ufie mana o nwereike ịyọ ịchaka e ji a akụ ya bụ egwu.

Mazị Agụ na-akụ Ufie n'omenala mana ụka.

Gịnị ka 'ufie' bụ?

Ufie bụ ngwa e ji akụrụ ndị Eze egwu n'ala Igbo.

E si n'osisi ugu akọpụta ya bụ ngwa egwu.

Ọ bụ sọọsọ ndị mụtara ya bụ ngwa egwu na-eti ya.

Sylvester Ifeanyichukwu na-asị na ọ bụ sọọsọ ndị echiri echichi ka a na-akụrụ ya bụ ngwa egwu a.

Kirie ya n'ụjụ.

Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru