"Na mmụọ ka agwara m ga kụwa ufie, ngwa egwu Igbo a na-akụrụ ndị Eze"
Ufie bụ Ikoro pụruiche a na-akụkarị na Mbaukwu, Anambra steeti.
Ihe ngwaegwu a ji pụọ iche bụ na ikoro ndị ọzọ na-adịna ala mana Ufie na-akwụ ọtọ.
Mazi Sylvester Ifeanyichukwu Agu bụ onye e ji Eze Ufie n'Igbo niile were mara sị na ọ bụ mmụọ kuziere ya ịkụ ya bụ ngwaegwu.
O sị na ya malitere ịkụ ya bụ Ikoro n'afọ 1991.
Ọ sị na "Ufie bụ egwu ndị Eze na ndị Chiri echichi. Ndị nze na ọzọ".
Ọ sị na ya bụ ngwaegwu na-alazị ala maka na "e rukwaghị mmadụ ise n'akụ ya n'ala Igbo".
Mazị Agu ji Ufie ekwu okwu dị iche iche.
Ọ na-atụkwa ya bu ekwe bụ nke o ji Oke osisi ngwu atụ.
Ọ sị na Ngwụ bụ oke osisi n'ala Igbo nke pụtara na onye ji ya atụ ya bụ ekwa na-akpachapụ anya ya.
Ịkpachapụ anya abụghị naanị maka ịba onye ahụ n'anya maka okpukpo ọ na-ekpo, ka ma na onye ahụ kwesiri ịdowe onwe ya asọ.
Ọ sị na nwaanyị anaghị atụ ufie mana o nwereike ịyọ ịchaka e ji a akụ ya bụ egwu.
Mazị Agụ na-akụ Ufie n'omenala mana ụka.
Gịnị ka 'ufie' bụ?
Ufie bụ ngwa e ji akụrụ ndị Eze egwu n'ala Igbo.
E si n'osisi ugu akọpụta ya bụ ngwa egwu.
Ọ bụ sọọsọ ndị mụtara ya bụ ngwa egwu na-eti ya.
Sylvester Ifeanyichukwu na-asị na ọ bụ sọọsọ ndị echiri echichi ka a na-akụrụ ya bụ ngwa egwu a.
Kirie ya n'ụjụ.
Ndị mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka na Chiemela Mgbeahuru