Ụlọikpe ajụla arịrịọ ịhapụ Abba Kyari nwa mgbe nta

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja ajụla arịrịọ ndị ọkaiwu Abba Kyari bụbu osote Kọmishọna uweojii na-arịọ ka a gbapụta ya nwa mgbe nta.

Ọkaikpe Inyang Ekwo nke Federal High Court dị n'Abuja kwuru n'ụbọchị Mọnde, Febrụwarị 28, 2022, na ha agaghị enye ya ohere ka ọ kwụọ ụgwọ nwere onwe ya nwa mgbe nta (bail), n'ihi na ụlọikpe ọzọ - nke Ọkaikpe Zainab Abubakar nọ n'isi ya - enyela National Drug Law Enforcement Agency's (NDLEA) ikike imecha nnyocha ha na-eme n'isi Kyari n'ime abalị 14 ọzọ na-abịanụ.

Ọkaikpe Ekwo kwuru na ụlọikpe ahụ kpenyeere NDLEA n'ụbọchị 22 nke ọnwa Febrụwarị, bụ ụlọikpe nwere ikike ikpekwa ikpe ahụ.

O kwuru na ọ ga-ekpekwa ikpe ahụ mgbe ụbọchị 14 ụlọikpe nyere gachara.

O yigharịrị ụbọchị ikpe ahụ buga ya ụbọchị 15 nke Maachị, iji kpee ya bụ ikpe maka ikike ruru Kyari dịka mmadụ.

Cheta na Kyari bụ onye a nwụchiri maka ebubo ibu ọgwụ ike, tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe n'izu gara aga ebe o kwuru ka gọọmentị etiti Naịjiria kwụọ ya nde narị naịra ise (N500m) ma rịọkwaa ya mgbaghara n'akwụkwọ ntaakụkọ abụọ maka imegide ikike ruru ya dịka mmadụ.

Kyari gbara akwụkwọ a site n'aka ọkaiwu ya bụ Cynthia Ikena, n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja, ma kwuo na ahụ esighi ya ike ịnọ na mkpọrọ, rịọ biko ka a hapụtu ya nwa mgbe nta ka o nwee ike ilekọta ahụike ya.

Ọ gwara ụlọikpe na ọ na-arịa "ọrịa shuga, ọbara mgbali elu na ezigbo ọrịa obi nwere ike ibutere ya ọnwụ."

Guillame Soro nke Ivory Coast agọrọla isi ya n'okwu ngwaagha a hụrụ n'ụlọ ya

Guillaume Soro bụbu onyeisi ụlọomeiwu mba Ivory Coast agọọla agọ na ahụghị ngwaagha ọbụla n'ụlọ ya na Bouake, n'isiobodo Abidjan.

Toure Moussa na-ekwuru ya sị na o bibeghi ebe ahụ kemgbe ọtụtụ afọ, dịka ọ gbagara Europe n'afọ 2019.

Nchọpụta a na-abịa ka a chọtachara ọtụtụ ngwaagha n'ụlọ Souleymane Kamarate Kone, bụbu onye isi nhazi ya n'afọ 2017.

Ndị otu Soro kwuru na akụkọ a so na nkata a na-akpa iji dughie ndị mba Ivory coast.

Cheta na a tụrụ Soro nga mkpụrụ ọka n'azụ ya (nke a kpọrọ 'in absentia') n'ọnwa Juun afọ 2021, ka e boro ya ebubo ịkpa nkata nnapụ Onyeisiala Alassane Ouattara ọchịchị n'ike.