Enugu Erosion: Ndị Obollo Afor n'Enugu Steeti etiela mkpu akwa maka mbuze na-akpa ike na be ha
Oke Mbuze na-akpa ike ugbua n'obodo Ogwu, Obollo Afor nke dị n'okpuruọchịchị Udenu, Enugwu steeti.
Ya bụ mbuze malitekwara ịkpa ike ọzọ bụ nke dịgoro ihe karịrị afọ iri ise na enweghị enyemaka ọbụla site na-aka gọọmenti nke steeti maọbụ nke etiti.
Oge BBC Igbo rutere n’obodo Ogwu, Obollo Afor, anyị hụrụ na ya bụ mbuze eriela ọtụtụ ụlọ, nke na Community Primary School Ogwu nwereike ịdaba na ya bụ nnukwu onunu oge adighị anya.
Ụmụ ikorobia obodo Ogwu kwuru na ha na ayọ gọọmenti ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka tupu mbuze ahụ erie ụlọakwụkwọ nakwa ọtụtụ ụlọ ndị mmadụ ometụtara.
Onyeisi ndị ntorobịa ahụ bụ Maazị Ogbonna Enyinna Odumegwu sị na mgbe ihe karịrị afọ iri abụọ ka ha yọbara gọọmenti ka ọ rụọ ya bụ mbuze. Ọ kwara arịrị na ugbua ọtụtụ mmadụ atufuola ndụ ha n'ime onunu ahụ.
Ndị ntorobịa Ogwu ọzọ bụ Izuchukwu Malachi Odoh na Kyrian Ezeme Uchenna tinyekwara ọnụ yọọ onyeisi oche okpuruọchịchị Udenu bụ Solomon Onah, Gọvanọ Enugwu bụ Ifeanyị Ugwuanyị nakwa Onyeisiala Naijiria bụ Mohammadu Buhari ka ha cheta nnukwu ahụhụ ndị obodo ha na-ata n'ihi mbuze a.
Ka ọ dị ugbua, ụzọ awara awara ochie si Obollo gaa obollo Eke nakwa Benue steeti abụrụla nke mbuze kewara abụọ.
Ụlọakwụkwọ Community Primary School Ogwu bụzị ebe ndị ọkwọ ọgba tum tum na ndị jị ụkwụ si agafe, n'ihi na ụgbọala agaghị agafe ya bụ ụzọ mbuze mebiri.
Ọtụtụ ndị okenye dịka Ozioko Michael Obeta na Hyginus Eze Obollo gwakwara BBC Igbo na ọ bụ ihe ihere na ihe a na-eme na okpuru ọchịchị Gọvano Ifeanyi Ugwuanyi, onye si na agbataobi ha bụ Orba ma bụkwara nwanne ha onye okpuruọchịchị Udenu.
Cheta na ọnwa Decemba 2021 ka Senatọ Ike Ekweremmadụ na ogbo ya nke House of Assembly bụ Toby Okechukwu gara njem nleta na ya bụ mbuze were kwee ndị Ogwu Obollo Afor nkwa na ha ga-etinye anya ịhụ na-etinyere ego iruzi ya bụ mbuze na bọgetị afọ 2023 tupu ọtaa isi mmadụ.
Kọmishịọna na-ahụ maka ọrụ n'Enugwu steeti bụ Mazị Greg Nnajị gwakwara BBC Igbo na gọọmentị Enugwu anọrọlarịị ọrụ n'ebe dị ịcheịche mbuze na-akpa ike n'Obollo Afor nakwa gburu gburu ya.
O kwuru na gọọmentị ga na-aga n'ihu ịhụ na ha ruziri ebe niile mbuze mebiri maka ọ dị mma ndụ na akụ n'ụba ndị mmadụ.
Etu mbuze si enye nsogbu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa
Mbuze bụ otu ọdachi na-enye nsogbu na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa, ọ kachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ọdachia a na-akwanye njọ ugbua n'ihi oke idei mmiri nke nsogbu mgbanwe ihu eluigwe na-akpata.
N'afọ 1981, gọọmentị wepụtara atụmatụ a kpọrọ 'Ecological Fund' iji buo agha megide ọdachi eke (natural disaster).
Atụmatụ a kwuru na a ga na-ewepụta pasentị abụọ n'ime ego niile na-abata n'akpa gọọmentị iji gbochie ọdachi ndị a.
N'ime afọ ndị gara aga, gọọmentị etiti Naịjirịa esila n'ime 'Ecological Fund' ksesaa ijeri kwuru ijeri Naịra nye steeti dị icheiche iji rụọ ọrụ maka ịkwụsị mbuze na ihe ndị ọzọ.
Mana odoghị anya kpọmkwem etu gọọmentị steeti si etinye ego ndị ahụ n'ọrụ.


