You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ghana Explosion: Gọọmentị mba Ghana amalitela inyocha ihe butere ọgbụgba ogbunigwe gburu mmadụ iri na atọ
Gọọmentị mba Ghana amalitela ịmenchọpụta gbasara ya bụ ogbunigwe tara isi mmadụ iri na atọ (13) n'Apiate dị n'ọdịdị anyanwu mba Ghana.
Ya bụ akụkọ na akọwa na mmadụ iri itoolu (90) agbakelarị ebe mmadụ iri atọ n'isii (36) ka na-anata ọgwụgwọ.
Onyeisiala mba bụ Nana Akufo Addo agala mgbaru na be ndị ya bụ ihe metutara dịka ọ gbaruru gbasara ya bụ ihe.
Ya bụ ogbunigwe gbara n'ebe a na-egwụpụta ihe akụ ọnatarachi n'akụkụ obodo Bogoso.
Ndị uweojii kwuru na ụgbọala bu ogbunigwe ahụ na otu ogbatumtum kwakọtara isi ọnụ nke kpalitere ya bụ ihe mberede.
Onyeisiala Ghana, Nana Akufo-Addo, ekwuola na ndịagha esonyela na mbọ inye aka zọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede a mere.
Ka ọ dị ugbua, Minista mgbasaozi bụ Kojo Nkrumah kwuru na ihe karịrị mmadụ 59 merụrụ ahụ n'ihe a merenụ.
Lee ụfọdụ ndị merụrụ ahụ n'ihe mberede ahụ:
Amerịka etinyela ọnụ n'esemokwu Russia na Ukraine
Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken na Mịnịsta mmekọ obodo n'obodo nke mba Russia bụ Sergei Lavrov ga-enwe mkparịtaụka na Geneva, Switzerland, gbasara esemokwu dị n'etiti Russia na Ukraine.
A na-atụ egwu na agha nwere ike ịda n'etiti mba abụọ ma ọ bụrụ na esemokwu a akwụsịghị.
N'ụbọchị Tọzde, Blinken dọrọ Russia aka na ntị maka ihe egwu nwereike ime ma ọ bụrụ na ndịagha ha gafere oke ala mba abụọ ahụ.
Ugbua, Rọshịa nwere ndịagha ruru 100,000 n'ogige oke ala mba abụọ ahụ, n'agbanyeghi na ha gọnarịrị atụmatụ ịwakpo ebe ahụ.
Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin siri ọnwụ na e kwesịghị ikwe ka mba Ukraine sonye otu North Atlantic Treaty Organization (Nato).
Ọ kwukwara na ọ chọrọ ka otu ndịagha Nato kwụsị ọrụ agha ha n'akụkụ ọwụwa anyanwụ Europe niile.
Cheta na Russia jichiburu mpaghara Crimea nke dị na ndịda Ukraine n'afọ 2014.
Kamgbe ahụ, ndị agha Ukraine na ụfọdụ ndị ọgụ nnupu isi nọ n'agha, mana Russia na-enyere ndị agha nnupu isi ahu aka.
Ọgụ a ataala isi mmadụ puku iri na anọ, ebe ihe karịrị mmadụ nde abụọ agbaala ọsọ ndụ pụọ n'ụlọ ha.
Ọgwụ mgbochi Covid 19 ga-abụzi iwu n'Austria
Mba Austaria na-agbasi mbọ ike ugbua ihibe iwu ga-amanye ndị mmadụ ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa Covid-19.
Ndị ụlọ omeiwu mba ahụ akwadola atụmatụ gọọmentị itinye ya bụ iwu ọhụrụ, bụ nke a tụrụ anya na ọ ga-amalite n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Febụwarị.
Mba Austria bụ mba mbụ ga-amanye ndị mmadụ ka ha gbaa ọgwụ mgbochi a.
Malite n'ọnwa Maachị 2022, onye ọbụla na-agbaghi ọgwụ mgbochi Covid-19 ga-enweta ntaramahụhụ ida nha ruru € 3,600.
A ga-eli Halifat dịka ndị mmadụ na-akwa arịrị na Twitter
Na Naịjirịa, akụkọ kacha ewu na Twitter bụ akụkọ gbasara obere nwaada Hanifa Abubakar, bụ onye akụkọ kwuru na ọ bụ onye nkuzi ya tọọrọ ya ma gbuo ya na Kano steeti.
Ezinụlọ Hanifa kwuru na a tọọrọ nwa ha n'ọnwa Disemba 2021 ma gbuo ya, n'agbanyeghị na ha akwụọla ndị ntọ ahụ ụgwọ ruru nde naịra isii.
A ga-eli nwatakịrị nwaanyị a taa bụ Fraịde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Jenụwarị 2022.
Ndị uweojii Kano steeti kwuru na ha chọpụtara ozu nwatakari ahụ n'ebe ndị ntọ ahụ liri ya n'azụ ụlọakwụkwọ ha.
Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Abdullahi Haruna kwuru na ha anụwchịela mmadụ atọ bụ ndị aka ha dị n'ọnwụ nwata ahụ, nke gụnyere onye nkuzi ya.
Oge ndị ntaakụkọ gbara onye nkuzi ahụ ajụjụ, o kwuru na ihe kpatara o ji gbuo nwata ahụ bụ maka ọ matara ihu ya.
Ọ kọwakwara na ọ bụ ọgwụ oke ka o ji gbuo ya ma lie ya n'azụ ụlọ akwụkwọ ha.
N'olu akwa na obi mgbawa, nna Hanifa bụ Mallam Abubakar Abdussalam gwara BBC na ọ na-obi agbawala ya na ezinulo ya maka ihe a mere.
Ugbua, nna nwata a na-arịọ ọha ka agbatara ya ọsọ enyemaka ịhụ na o nwetara ikpe ziri ezi.