You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Breast pain: 'Ovulation', ara ibu ibu, inye nwa ara na ihe ndị ọzọ nwere ike ibute ara ịfụ nwaanyị ụfụ
Ọtụtụ ụmụnwaanyị nwere mgbe ara ha na-afụ ha ụfụ. Ihe na-akpata ya dị iche n'iche n'ebe ụmụnwaanyị nọ.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na mgbe ọbụla ara na-afụ nwaanyị ụfụ, na ọ bụ maka ọrịa kansa maọbụ ọrịa ndị ọzọ. Mba! Ara ifụ nwaanyị ụfụ abụghị naanị mgbe o butere ọrịa.
Dịka dọkịnta Udodi Okoli siri kọwa, ihe nwereike ime ka ara na-afụ nwaanyị ụfụ dị ọtụtụ.
O nwereike bụrụ mgbaama ọrịa, maọbụ ihe ọzọ na-abụghị ọrịa dịka ara ibu oke ibu na nwaanyị eyighị akpa ara dị mma nke ndị Bekee na-akpọ bra.
2. Nwaagbọghọ Chimamanda Okafor sị na ara ya na-afụkarịrị ya ụfụ mgbe ọbụla ahụ ya nọ n'ihe ndị Bekee na-akpọ 'ovulation'.
Ọ sị na ahụ ya ga na-eme ya ka ọ gakwuru nwoke ka ha nwe aramara.
3. Chioma Nkemdilim sị na tupu nsọ ya ebido, ara ya ga-afụrịrị ya ụfụ. Mgbe ahụ, ara ya abụọ ga-ebutu ibu, ma na-afụ ya ụfụ.
4. Chimezie Ucheagbo bụ nwaanyị na-enye nwa ara ugbua sị na mgbe mbụ ọ chọrọ inye nwa ya ara, na ara ya fụrụ ya ụfụ nke ukwu. Mana mgbe nwa ya na-amị ara ya, ụfụ ahụ belatara.
O kwukwara na ọ bụrụ na nwa gị etinyeghị ọnụ ya nke ọma n'ọnụ ara gị, ọnụ ara gị nwereike fụọ gị ụfụ maọbụ gbawa. "Mgbe nke a mere m, ọ fụrụ m ụfụ nke ukwuu. Agaghị m akọwalị ụfụ ya."
Ihe a ka nwaada Ucheagbo gwara BBC Igbo maka etu ụfụ ahụ dị.
Chimezie kwuru sị, "ọ bụrụ na ọnụ ara gị gbawa, ọ ga-aba ọnya nke na-eme ka ụfụ ya ka njọ. Nwaanyị ahụ nwereike ibute ọrịa site n'ọnya ahụ."
Ọ gwara BBC Igbo na ụdịrị ụfụ ọzọ ọ gabigara bụ mgbe nwa ya na-adịghị amịkọwa ara ya, nke a mere ara ya abụọ jiri gbajuo dọrọ, na-afụkwa ya ụfụ ma na-anyịkwa ya arụ.
5. Otu nwaanyị na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru sị na ara ya na-afụ ya ụfụ mgbe ọbụla ọ na-eme egwuregwu mmegharịahụ dịka igba ọsọ, iwuli elu, dgz.
Ka o si kọwaa, "m gbachaa ọsọ, ara m na-afụkarị m ụfụ makana o buru ibu."
Ọ gwara BBC Igbo na ọ na-eyizi uwe akpa ara dị mma iji belata ụfụ ya.
6. O nwere ụdịrị ụfụ ara na-egosi mgbaama ọrịa kansa. Juliet Uzoma, onye rịaburu ọrịa kansa ma gbakee, gwara BBC Igbo na ọ dị afọ 34 mgbe ọ chọpụtara na otu ara ya na-afụ ya ụfụ ma na-agbapụta ihe na-acha ụcha.
O kwukwara na mgbe ahụ, okpuru mkpa abụ aka ya na-egbu ya mgbu. Ọ bụ mgbe ọ gara mee nnyocha ka ọ chọpụtara na ọ bụ kansa.
Dọkịnta Okoli kọwara na ihe ndị ọzọ nwereike ịkpata ara ifụ nwaanyị ụfụ bụ abụ dị n'ara nke ndị Bekee na-akpọ abscess.
Maọbụ ọnya mere na-ara nke butere nje ndị Beke na-akpọ 'mastitis'.
Iji gbochie ara ifu nwaanyị ụfụ, dọkịnta Okoli kwuru na ọ dị mkpa ụmụnwaanyị ime ihe ndịa:
- Iyi akpa ara dị mma.
- Ka ha na-agbanwe akpa ara ha kwa mgbe.
- Ka ụmụnwaanyị mara etu ha ga-eji aka ha lele ara ha anya iji mara mgbe ihe na-agbanwe na ya.
A bịa n'ọrịa kansa, dọkịnta na-ahụ maka ahụ mmadụ gwara BBC Igbo na ọ dị mkpa ka ụmụnwaanyị na-abịa ụlọọgwụ maka nnyocha ahụ ha nke ndị Beke na-akpọ 'mammogram'.
Tụmadị ndị rugoro afọ 40 na-agbago elu.
Onye mere akụkọ a bụ Vining Ogu