You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Imo Killings: Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo mmadụ anọ n'ahịa Aṅara dị na steeti ahụ
Ndị omekome egbuola mmadụ anọ mgbe ha wakporo otu ahịa dị n'obodo Aṅara n'okpuruọchịchị Isiala Mbano n'Imo steeti.
Mmadụ atọ nwụrụ n'ebe ahụ ozugbo ozugbo ebe onye nke ọzọ nwụrụ dịka ebugara ya ụlọọgwụ.
Ndị nọ ebe ihe mere gwara BBC Igbo na ndị omekome ahụ bu ụgbọala Sienna ọcha were bịa ya bụ ije.
Ha kwukwara na ha esighi n'ụgbọala ha ritue kama nọrọ n'ime ya malite ịkwa mgbọ n'ebe ha na-agafe n'ahịa ahụ.
"O nweghi onye ma ihe bụ ebumnuche ndị ahụ ụdịrị ihe a emebeghi mbụ. Otu onye so na ndị nwụrụ bụ nwoke na-agba ọgbatumtum bịara iri nri n'ebe a"
"Ilee anya, ị ga-ahụ na ndị mmadụ agbaala ọsọ n'ebe a, ebe niile tọgbọ chakoo" ka ndị nọ ebe ihe ahụ mere kwuru.
Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ, anyị hụrụ ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ maka ndị uweojii nọ ebe ahụ
Lee ka o si mee n'uju ebe a:
Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Rabiu Hussaini enyela iwu ka amalite nyocha banyere ihe mere.