You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Sir Bernard Enweremadu: Ihe i kwesiri ị ma maka Eze a larala mmụọ
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ezinaụlọ Eze Bernard Enweremadu nakwa ndị Abia steeti ozi nkwado na iti aka n'obi gbasara ọnwụ Eze Bernard Enweremadu.
Enweremadu nwụrụ ka ọ gbachara afọ 77 bụ onyeisi ọgbakọ eze ndị ọdịnala nke Abia steeti rue 'ụbọchị 17 nke ọnwa Jenụwarị afọ 2021 ọ lara mụọ.
Mana dịka e si eme omenala, a maghị ọkwa ọnwụ Eze Ngwaukwu nke dị n'Abia steeti bụ onye nọrọ n'ọkwa ya afọ 44 tupu ọ nwụọ ka e si eme ibe ya.
Oke mmụọ a na-anụ aha ya n'Abia nakwa Naijiria gbaa gburu gburu.
N'ozi ya nke Shehu wepụtara n'akara Facebook ya Buhari toro Enweremadu ma kelee ya maka aja niile ọ ji onwe ya chụrụ ndị be ha.
Ọ sị, "Onyeisiala Buhari chetara ihe ọma ndị omere n'ịhapụ ihe ndị ọ na-eme na Legọs ma lakwuru ndị be ha n'afọ 33 iji debe omenala na njirimara ndị be ha".
E be ahụ ka ọ nọsị ike rue afọ 77 mgbe ọ zara oku ikpeazụ a kpọrọ ka ozi ahụ kwukwara.
Onye bụ Eze Bernard Onynguzoro Enweremadu?
- E chiri ya Eze Ngwukwu n'afọ 1976 mgbe ọ ka dị naanị afọ 33.
- Ọ nọrọ n'oche ahu rue mgbe ọ nwụrụ na Jenụwarị 17 afọ 2021.
- Ọ bụ ya bụ Eze Ngwa nke iri na atọ.
- O kpokọbara otu njịkọaka na mmekọ bụ Ukwa La Ngwa Socio-Cultural Association n'afọ 1982.
- E cheere na ọ lụrụ nwaanyị iri na atọ ma a maghi ezi ọnụọgụgụ ụmụ ole o nwere.