Sudan coup 2021: Ihe anyị ma maka Lt. General Abdel Fattah al-Burhan, onye isiagha wegharala ọchịchị n'ike na mba Sudan

Ndị mmadụ awụjuola n'ụzọ na ngagharịiwe dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha na-anwa iweghara ọchịchị n'ike na mba Sudan.

Nke a malitere n'isi ụtụtụ Mọnde, 25 nke ọnwa Ọktoba 2021.

Onye bụ onye isi agha General Abdel Fattah al-Burhan wegharala ọchịchị n'ike na mba Sudan

  • Onye isi agha wegharịrị ọchịchị n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Sudan bụ General Abdel Fattah al-Burhan n'ụbọchị 25 Ọktọba ịgbanahụ agha ime obodo ime mba Sudan.
  • O wepụrụ Praịm Minista Abdalla Hamdok ma wuchie ya n'ụlọ ya maka "ọdịnamma nke Praịm minista"
  • N'ọnwa Ogọst, 2019 ka ọ kpọwara onwe ya onyeisi ala mgbe ọ bụrụrla onye isi ọgbakọ ndị ọchịchị a kpọọrọ Sovereign Council.
  • 2015 ka ọ chịkọtara ndị agha gara ọgụ ndị a kpọrọ 'Sudan ground forces'. Ọ bụ ya chịkọtara ndị agha lụkọrọ n'agba ndị Saudi n'agha Yemen.
  • O nwere ihe jikọrọ ya na ndị isiagha Gulf ọ bụ ya bụ oonye isi nchịkọta ndị agha Sudan n'agha Yemen.
  • Ka o wegharịrị ọchịchị n'aka Praịm Mịnịsta Bashir, Burhan na ndị United Arab Emirates, Saudi Arabia na mba Egypt arụkọwazie ọrụ.
  • Mba ndị Gulf zitekwara enyemaka nye Khartoum.
  • N'ọnwa Maachị ka ọ nabatara Onyeisiala Egypt bụ Abdel Fattah al-Sisi na Khartoum.
  • Ọ bụ mgbe al-Burhan sonyere ndị chụpụrụ Onyeisiala Omar Hassan al-Bashir n'oche na 2019 ka ọ banyere anya ọha.

Ihe anyị ma dịka ndị agha na-anwa iweghara ọchịchị n'ike

  • Ndị agha anwụchiela ndị minista anọ ma jichie Praịm minista mba ahụ bụ Abdallah Hamdok n'ụlọ ya
  • Ndị agha bucha ngwaagha anọchiela mpaghara isiobodo Khartoum, dịka ndị na-eme ngagharịiwe na-akpọ taya ọkụ
  • A kwụsịla ịntanetị n'isiobodo mba ahụ
  • Ndị agha awụchiela isiụlọọrụ mgbasaozi n'isiobodo ahụ
  • Mba Amerịka sị na ọnọdụ a na-enye ha nchekasị

E mechiela ọdọụgbọelu dị na Khartoum

Njem ụgbọelu akwụsịtụla n'isiobodo Khartoum dịka akụkọ ya bụ mweghara ọchịchị n'ike na-arị ibe ya elu.

E mechiela ma gbochie igaru na ya bụ ọdọụgbọelu Khartoum, dịka ndị agha gbara ogige ahụ gburugburu.

Ka ọ dị ugbua, gọọmentị mba ahụ agbasabeghi ozi ọbụla gbasara ya.

Ndị agha awụchiela n'ụlọmgbasaozi - mịnịstrị

Mịnịstrị mgbasaozi nke mba Sudan ekwuola na ndị agha wụchiri n'isiụlọọrụ mgbasaozi dị na Omdurman, nso isiobodo Khartoum.

Ha kwuru na ndị agha a ejichiela ndị ọrụ nọ ebe ahụ.