Anambra election update: Ihe ole ma ole dị mkpa ị kwesiri ịma maka Valentine Ozigbo nke PDP

Aha onyonyo, Mkparịtaụka BBC Igbo na Valentine Ozigbo

BBC Igbo na Valentine Ozigbo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti na ntuliaka nke e mere na Nọvemba 2021 nwere mkparịtaụka pụrụịche ebe ọ kọwara ihe mere o jiri kpebie ịzọ ọkwa gọvanọ Anambra Steeti.

Ozigbo kwuru etu o si too were gaa ụlọ akwụkwọ ma bụrụ onye isi kacha acha anụ ọkụ mgbe ọ bụ nwata akwụkwọ.

Nke a mere ka ọ nwete nturuugo ịgụ akwụkwọ Mahadum n’efu na mba Ịnglandị.

Lee ihe onyonyo a ka ị nụrụ etu nne na nna ya siri zụọ ya ma ihe ndị obodo ya na-ekwu maka ya.

Cheta na

Ntụliaka Anamabra Steeti nke 2021 bụ ntụlịaka anya mmadụ niile nọ na ya n'ihi na ọ bụ nkwụcha ọchịchị afọ asatọ Willie Obiano.

Ọ bụ ntụlịaka a ka a ga-eji họpụta ọnye ga-anọchị Gọvanọ Willie Obianọ onye banyere ọchịchị n'afọ 2014.