Anambra election 2021: 'Charles Soludo esoghị anyị chụgharị ụmụnwaanyị oge anyị na-eto'

Aha onyonyo, Charles Soludo: Ihe ịtụnanya ole m ole ndị enyị na agbata obi ya nwere ikwu gbasara ya

Dịka Charles Soludo na-agba mbọ inweta ọkwa oche gọvanọ Anambra steeti na ntụliaka 2021 nke e hiwere n’ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba, BBC Igbo gara n’ogbe ya n’Aguata nọ n’Anambra State jụọ

ndị enyị na agbata obi ya ịjụta ihe ha ma maka ya bụ nwoke.

Ajụjụ ọnụ a gbara n’anwụ ihe ole m ole na-atụ n’anya banyere ya.

Ihe ndị a gụnyere etu Soludo siri too, ebe a mụrụ ya, ụdị mmadụ ọ bụ na nwata, etu o si mee n’ụlọ akwụkwọ ya dị iche iche, mmekọ ya na ụmụ nwaanyị nakwa mbọ ole m ole ọ gbara n’oge gara a ga kwaara ya ụzọ iru ogogo ọ nọ ugbua.