Abdulaziz Chivuzor Ude: Lee ihe anyị chọpụtara maka odogwu a biputere akwụkwọ 'Things Fall Apart'

Ọtụtụ mmadụ amaghị nnukwu mmọnwụ a Oliver De Coque gụrụ n'egwu kemgbe eri bụ onye e liri ụnyaahụ bụ Satọde 18-9-2021.

Lee ihe ụfọdụ pụrụiche ị kwesiri ịma maka ya.

  • Ezigbo aha ya bụ Abdulaziz Chivuzor Ude
  • Ọ bụ onye Abor dị n'Enugu steeti, Nigeria
  • Amụrụ ya ọnwa Septemba 30, 1940
  • Aha nwunye ya bụ Maimuna Ude
  • Ọ bụ ya biputere akwụkwọ "Things Fall Apart" nke Chinua Achebe dere n'afọ 1958
  • Ọ gụrụ na st. Patrick's School, Ogbete. Enugu, 1947-56
  • Gụkwa na College of the Immaculate Conception, Enugu, 1957-63
  • Si ebe ahụ gụọ na The British Drama League, London, 1964
  • Ọ gakwara na Banyezie Queen's College, University of Oxford, England, 1964-68 bụ ebe ọ gụrụ philosophy, economics na politics

Ọ gakwara Columbia University. Morningsidc Heights, New York, USA, 1968-69 ebe ọ nọ gụọ International relation ya bụ mmekọrịta mba na mba.

Mechaa kuzie na College of the Immaculate Conception, Enugu, 1963-64

Mechaa buru Editor, Anchor Books. Double Day and Company Inc., 1969-73

Ọ mechara malite ụlọọrụ na-ebiputa akwụkwọ akpọrọ Nok Publishers International, New York.

O so na ndị isi ụlọọrụ ntaakụkọ na Naịjirịa a kpọrọ Newswatch Communications Ltd kemgbe 1984

Abdulaziz bụ onye na-ebiputa akwụkwọ bụrụkwa onye ihe gbasa akwụkwọ na-echụ ụra.

A ma ya dịka onye dị umeala bụrukwa onye obi ebere na-enyere ndị nọ na nsogbu aka.

Ọ bụ onye ụka Alakụba.

Abdulaziz so tinye aka n'akwụkwọ maka ike Anambra, Enugu, Delta na Ebonyi steeti mgbe Ibrahim Babangida na-achị.

O nwepụtara ụgbọelu ya e ji bugharịa mmadụ dịka Alex Ekwueme, Chike Edozie, Akanu Ibiam, Chief CC Onoh na Dr Okadigbo maka ịhe gbasara okwu steeti ndị ahụ.

Ọ bụ n'ụlọ ya dị na 59 Awolowo Road, Ikoyi, Lagos, ka a nọ mee ihe niile dị n'ike steeti ndị ahụ.

Ụlọọrụ ndị Abdulaziz Chivuzor Ude nọ n'isi ya

Nok book publishing Enugu, New York, London na Lagos bụ nke biputara akwụkwọ Chinweizu Chinweizu akpọrọ " The West and the Rest of Us" na nke Romanus Egudu bụ "Study of Four West Africans" wdz.

The Financial Post Communications Ltd, Lagos, 1988

Tanhigh Holdings Ltd

Trans Sahel Airlines Ltd

150 Estates Nigeria Ltd

Tanhigh Finance Ltd

Ọ bụ otu n'ime ndị isi African Business Roundtable

African Development Bank

British Drama Board

Nturu ugo o ritere

Nobel Patron of the Arts

Ghana Association of Writers, 1990

Talent Hunter of the Year

Man of the Year, Nigeria Union of Journalists, 1992

Industry/ Personality Eko Award, 1992

Paul Harris Fellow, Rotary Club. Abakpa Nike

Zik Prize in Uadership (Business), 1995

Ebube Ndi Muslim of Igboland, Oduneje Ogu nke Abor Boroji nke Lagos.