Polyandry: Ụmụnwaanyị enweela ikike ịlụnwuzi karịa otu di?

    • Onye dere ya, Pooja Chhabria
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service

Mgbe ọ ka na-etolite etolite, Muvumbi Ndzalama na-ajụkarị ajụjụ gbasara omenala ịlụ naanị otu onye. O chetara etu o si jụọ nne na nna ya ma ọ bụ naanị ha abụọ ga-ebikọta ọnụ ruo mgbe ha nwụrụ.

Ọ gwara BBC sị, "Ọ dị m ka mmadụ ịnọ na ndụ gị kwesịrị ịbụ a gụrụ gụrụ ha abịa ma pụkwaa,"

"Mana ihe niile dị n'akụkụ m, site n'ihe nkiri ruo n'ụlọụka, nọ na-ekuzi maka ịlụ naanị otu onye, mana aghọtaghị m atụmatụ ahụ."

Muvumbi dị afọ 33 ugbua ekwuola na ọ na-ahụta onwe ya ka nwaanyị nwere ike ịyị/idina onye ọbụla gụrụ ya, ma nwoke ma nwaanyị, nakwa nwaanyị na-achọ ohere ka ndị na-agaghị alụli naanị otu onye na mba Saụt Afrịka nwee ike ịnọ na-anọghị n'ihe ize ndụ.

"Enwere m onye m na-ayị m kwere ịlụ ugbua, mụ na ya mụkọrọ ụmụ, ọ masịkwara onye nke ọzọ m na-ayị," ka o kwuru.

"Onye nke ahụ achọghị ịlụ nwaanyị... mana n'ọdịniihu, Ọ ga-amasị m ịlụ karịa otu di. Ị ma na abụ m 'pansexual', onye nwere ike ịyị/idina onye ọbụla gụrụ ya, n'agbanyeghi okike ya."

Nwaanyị ịlụ karịa otu di?

Saụt Afrịka so na mba ndị iwu ha atachaghị akpụ n'ụwa, dịka ha na-ekwe alụmdinanwunye ịdị n'etiti nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị nakwa nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị.

Mba ahụ na-atụ anya ịṅogharị iwu alụmdinanwunye ha ugbua, otu n'ime ihe ha na-ele anya bụ ajụjụ ma a ga-agụnye nwaanyị ịlụ karịa otu di otu mgbe nke Bekee kpọrọ polyandry.

Nke a emeela ka ụfọdụ ndị ọ na-amasịghị tie mkpu.

"Nke a ga-emebi omenala Afrịka. Kedụ maka ụmụ ndị a mụrụ? Kedụ etu ha ga-esi mara onwe ha na ndị ha bụ?" ka Musa Mseleku bụ ojiegoachụego nakwa onye ihe onyonyo ji nwunye anọ kwuru.

"Nwaanyị agaghị abụzị ihe nwoke bụ. Anaghị akọ nke a akọ. Nwaanyị ọ ga-akwụzị ụgwọ isi nke nwoke? Nwoke ahụ ọ ga-azawazị aha nna nwunye ya?"

Ndị ọzọ gụnyere Ụkọchukwu Kenneth Meshoe bụ onyeisi ndị na-ama pati nọ n'ọchịchị aka African Christian Democratic Party (ACDP), onye kwuru na nke a "ga-emebi obodo".

"Oge na-abịa mgbe otu n'ime ụmụnwoke ahụ ga-ekwu, 'gị na onye nke a na-anọkarịa karịa mụnwa' - mgbe ahụ nsogbu adapụta n'etiti ụmụnwoke abụọ ahụ," ka o kwuru.

'Nkwenye ndị mmadụ akwụdosighi ike'

Muvumbi kwuru na nke a ihe ndị mkpa nye ụmụnwaanyị na-ayị onye ọbụla masịrị ha nke mmadụ niile ma maka ya ma ghara inwe nsogbu ọbụla, nke bụ 'polyamorous' na Bekee.

O kwuru sị "Ọnọdụ a bụ ọnọdụ ịchị obi n'aka - nkwenye ọtụtụ mmadụ akwụdosighi ike.

"Ụmụnwoke na-alụrụ onwe ha nwunye ole masịrị ha maọbụ na-ayị nwaanyị ole masịrị ha kemgbe ụwa tụ ụwa, mana ọ ka bụ ihe e ji akwa ụmụnwaanyị emu, e kwesịrị ikuzigharịrị ndị mmadụ maka ya."

Muvumbi anaghị ezo na ọ na-ayị karịa otu onye kemgbe ihe karịrị afọ iri. "Mụ na ndị m na-ayị ma onwe anyị, ọ bụghị iwu na anyị niile ga-abụ enyi, mana achọrọ m ka anyị mara onwe anyị."

Na mbụ, ọ mabughi etu ọ ga-esi agwa ezinaụlọ ya mana o mechara gwa ha afọ ise gara aga mgbe mmekọ ya Mzu Nyamekela Nhlabatsi siwanyere ike.

"Mzu na-ayịkwa ndị ọzọ, achọghị m ọnọdụ ọ ga-agbagwoju ezinaụlọ m anya ma ha zute ya na onye ọzọ n'ụzọ, ya mere m ji gwa ha."

"Ọ bụkwa mgbe ahụ ada anyị nwaanyị nọ na-agba afọ ise, mgbe m bidoro ihe gbasara ikike ruru onye n'ọgbakọ a. M ga-apụta n'onyonyo na-ekwu maka nwaanyị ịlụ karịa otu di, achọghịkwanụ m ka ha si n'aka onye ọzọ chọpụta."

Ha anabatatụla ụdịrị ndụ Muvumbi na-ebi mana ọ sị na ije ka dị anya.

O kwuru maka mgbe Mvu bịara ịkwụ ụgọ isi ya "Ha jụrụ m ma ha a ga-atụwa anya nwoke ọzọ ịbịa ịkwụ ụgwọ isi m, m sị ha na nke a ka nwekwara ike ime."

"M ga-ebi ndụ m n'eziokwu m, ma ọ masịrị ha ma ọ masịghị ha."

'Ọ gbara mgbọrọgwụ n'iwu ụmụnwoke'

Ndị ikike dịrị onye n'ebe ọ metụtara okike na-agbasi mbọ ike ịhụ na e debanyere ya bụ iwu nwaanyị ịlụ karịa otu di n'iwu mba Saụt Afrịka, dịka iwu ahụ kwadoro ka nwoke lụọ karịa otu nwaanyị.

E debanyela ihe ha na-achọ n'akwụkwọ gọọmentị wepụtara ka ọha tinye ọnụ ha, dịka ha na-abanye n'ihe ga-abụ nṅogharị iwu alụmdinanwunye mba ahụ kemgbe ọchịchị ndị ọcha kwụsịrị n'afọ 1994.

Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa ka alụmdinanwunye nke ndị Alakụba, ndị Ju nakwa ndị Rastafari banyekwa n'iwu.

Muvumbi sị na ọ dị ka "ekpere a zara ya" ma kwuo na ihe a na-ekwu maka nwaanyị ịlụ karịa otu di gbara mgbọrọgwụ n'iwu ụmụnwoke.

Ọkammụta Collis Machoko, onye nkuzi n'ihe gbasara nwaanyị ịlụ karịa otu di na-ahụkwa otu ihe ahụ. "Mgbe ụka Kraịst na ọchịchị ndị ọcha batara, ihe nwaanyị bụ gbanweziri. Ha ahaghịzị nhatanha. Alụmdinanwunye bịazịrị bụrụ otu ngwaọrụ e ji hibe iwu dabarala naanị ụmụnwoke."

Ọ sị na mba ndị dị ka Kenya, DR Congo nakwa Naịjiria na-emebu ya bụ nwaanyị ịlụ karịa otu di, mba Gabon ka na-edebe ya bụ iwu ruo ugbua.

"Okwu gbasara ụmụ ha ataghị akpụ. Ụmụ ọbụla a mụnyere n'ụdịrị ihe a bụ ụmụ ezinụlọ ahụ," ka o kwuru.