Actress Doris Chima: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwaanyị a lara mmụọ taa

Doris Chima

Ebe foto si, Doris Chima/Facebook

Nwaanyị na-eme ejije "Nollywood" a ma ama bụ Doris Chima alaala mmụọ.

Akụkọ kwuru na ọ bụ ọrịa akpụ kansa dulara ya mmụọ.

Dịka akụkọ si kwuo, Emeka Ibe bụ onyeisi otu ndị ejije bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) nke Legọs steeti, kwuputara na ọ nwụọla n'ezie.

Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Doris Chima

A mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị 1958.

Ọ bụ onye Abịa steeti.

Facebook ya gosiri na ọ bụ mama nnukwu, dịka ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ya gburu gburu.

Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere 'Taboo II', Divided Love', 'Sweet Mother', 'Treasure', 'Taxi Driver' 'Beauty Parlour' nakwa ndị ọzọ.

O mekwara ejije a kpọrọ "Nana of Niger Delta".

Dịka aka ochie ọ bụ, o so na ndị hibere otu jịkọrọ ndị ejije bụ "Actors Guild of Nigeria (AGN)", ma bụrụkwa osote onyeisi AGN nke Legọs steeti.

E nwere mgbe o wuru ewu dịka otiegwu, mgbe o so mee asọmpi ndị na-agụ egwu nke ndị ụlọntaakụkọ Nigerian Television Authority (NTA) haziri n'afọ 1991.

Akụkọ kwuru na ọrịa kansa mere ya ịwa, nke mere a waa ya ahụ n'afọ 2020.