Hakainde Hichilema: E duola ya n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Zambia

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook
Eduola Hakainde Hichilema n'iyi ọrụ dịka onyeisiala mba Zambia.
Hakainde depụtara n'akara Facebook ya were kelee ndị mmadụ ma kwuo na oge eruola ka arụwa ọrụ iji kwalite mba Zambia.
Lee ụfọdụ foto iyi ọrụ ya.

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook

Ebe foto si, Hakainde Hichilema/Facebook
Lee ihe mgbe o meriri na ihe ị kwesịrị ịma maka Hakainde Hichilema

Ebe foto si, Reuters
Akpọpụtala aha Hakainde Hichilema dịka onye meriri ntuliaka e ji ahọpụta onye ga-achị Zambia dịka onyeisiala mba ahụ.
Maazị Hichilema ji ihe karịrị vootu otu nde merie Onyeisiala Edgar Lungu.
Ihe a bụ ugboro isii Maazị Hichilema zọrọ ọchịchị onyeisiala Zambia.
Maazị Lungu anabatala mmeri a ma kele Maazị Hichilema.
Dịka ọ na-anabata ekele a, Maazị Hichilema sị na ha agaghị agba Lungu anwụrụ anya mmiri maọbụ taa ya ahụhụ.
A na-awakpokarịrị Hichilema dịka ọ na-ekwu na ọ bụ etu ha jiri chọọ ịkpịchi ya ọnụ.
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na mba Zambia sị na Hichilema ji vootu 2,810,777 meriri Maazị Lungu nwetere vootu 1,814,201 na ntuliaka e mere n'ụbọchị Tọọzde.
Onye bụ Hakainde Hichilema?

Ebe foto si, EPA
A mụrụ Maazị Hichilema n'ezinaụlọ enweghị ka ọ ra ha na mpaghara Monze dị na ndịda Zambia.
Ọ nwara nwete enyemaka ịgụ akwukwọ na mahadum Zambia.
O mechara nwete asambodo MBA na mahadum Birmingham na UK.
O mechara soro n'ime ndị kachasị nwee ego na Zambia.
Maazị Hichilema na-achụ ego n'ọba ego, n'ịzụ anụmanụ, ụlọ, ahụike nakwa njem nlete.
Maazị Hichilema na-akọwa onye ya dịka "nwata ọchị ehi".
Ọ zọọla oche onyeisiala Zambia kemgbe afọ 2006. N'agbanyeghi na ọ na-ada, ọ na-enwete karịa nke o nwetburu kwamgbe.
N'afọ 2016 Maazị Hichilema sị na e zuru ntuliaka n'aka ya dịka Maazị Lungu ji vootu 100,000 merie ya.
E mechara boo ya ebubo imegide mba dịka o kweghi inye ụgbọla bu onyeisiala mba Zambia ohere n'okporo ụzọ.
Ọ nọ ọnwa anọ n'ime ulo mkpọrọ tupu e wepu ebubo ahụ.









