Nnamdi Kanu Trial: DSS ekweghi ka Kanu binye aka n'akwụkwọ enyemaka nke mba UK - Alloy Ejimakor

Okwu ọhụrụ dapụtara n'ikpe Nnamdi Kanu na-ekwu na ndị Department of State Service (DSS) bụ ndị ji ya ekweghi ya binye aka n'akwụkwọ ga-eme ka mba Briten nye ya enyemaka.

Nke a pụtara ihe n'ozi ọkaiwu ya bụ Alloy Ejimakor ziputara n'ụbọchị Monde.

O kwuru "e nyeghachiri m akwụkwọ enyemaka nke ga-eme ka mba Briten nyere Kanu aka ebe Kanu emetụtaghị ya aka"

"Ka m kwuo n'ezie, e nyere m ndị DSS akwụkwọ a kemgbe abalị ole na ole gara aga, ha kwetakwara na ha ga-enye ya Nnamdi Kanu

Mana ndị ọkaiwu DSS enyeghi ikike ka Kanu binye aka n'akwụkwọ ahụ n'ihi ihe ma amaghị rue ugbua" ka Ejimakor dere.

Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghi ihe nrite ọ hụrụ gọọmentị etiti ga-enweta n'ime nke a.

"Kama ihe ọ ga-eme bụ na ọ ga-egosi na gọọmentị Naịjirịa ma ụma agbachi enyemaka mba Briten irute Nnamdi Kanu aka"

O kporo okua ka ụlọ nnọchianaya nke mba Briten mee ngwa ngwa nyere Nnamdi Kanu enyemaka ruru ya dịka onye ala ahụ nke Kanu bụ.

Ha mee nke a, ọ ga-eme ka Nnamdi Kanu nwee mmekọ mmadụ na ibe ya maka na ugbua, ọ bụ naanị ndị ọkaiwu ya nwere ikike ịleta ya.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunanya mana ọ sị ka edetere ya ozi maka na ọ nọ na nzukọ.

Ruo oge akụkọ a pụtara Maazị Afunanya azabeghị ka o siri kwụrụ.