George Nkencho: Etu nwa afọ Igbo a si nwụọ n'aka ndị uweojii mba Ireland

Aha onyonyo, Ndị na-eme ngagharịiwe n'ihi ọnwụ George Kencho

Nne na nna George Nkencho si Naịjiria gafee mba Ireland oge ọ dị naanị afọ asatọ.

Mba Ireland so n'ebe a kacha akpaso ndị isi ojii oke agbụrụ na mpaghara Yurop niile.

O dochabeghị anya ihe kpatara ndị uweojii ji gbaa George Nkencho egbe n'agbanyeghị na ọ nọ n'ihu be ha, ebe ya na nne ya na ụmụnne ya anọ ndị ọzọ bi.

Ndị uweojii sị na George ji mma wee wakpo mmadụ, mana nnyocha ka na-aga n'ihu ịchọpụta nke bụ eziokwu.

Gere ihe nne ya na ụmụnne ya gwara BBC, nakwa ihe ndị uweojii kwuru.