You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ahmed Gulak: Etu e si gbagbuo ndị gburu Ahmed Gulak
Ndị uweojii imo steeti ekwuola na ha egbuola ndị ekperima ahụ gburu onye otu APC a ma ama bụ Ahmed Gulak n'ụtụtụ ụbọchị Sọnde.
Bala Elkana bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo steeti kwuru na ọ bụ n'ahịọ Afor Enyiogugu dị n'Aboh Mbaise ka ndị uweojii na ndị ekperima ahụ kwakọtara mgbọ ebe ha nọrọ zute ọnwụ ha.
Ha kwuru na ọ bụ ọkwọ ụgbọala bu Gulak mgbe a gbara ya egbe kọwara udiri ụgbọala ndị omekome ahụ bu bia kpaa mkpa mkpa a.
Ha kọwara ụzọ ndị ahụ si gbafuo nke mere ka ndị uweojii ahụ nwuchie ha n'ahịa Afor Enyiogugu dị n'ọkpụrụọchịchị Aboh-Mbaise ebe ha na-ekenye ndị obodo yabasị ha ji ike napụta gwogwolo bu ya.
Ha kwụsịrị gwogwolo bu yabasị si ugwu bata n'ike.
Ndị uweojii kwuru na ha napụtara ndị omekome ahụ egbe karịrị ise nakwa ụgbọala atọ ha ji gaa njem igbu Gulak.
Ha kwuru na ndị omekome ahụ ha gbgburu bụ ndị otu Indigenous People of Biafra Ipob nakwa Eastern Security Network (ESN).
Etu e si gbagbu Ahmed Gulak bụ onye otu APC n'Imo steeti
Ahmed Gulak bụ onye otu APC mabụrụkwa onye ndụmọdụ Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa anwụọla.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Bala Elkana kwuru na ọ bụ n'elekere nke asaa nke ụtụtụ May 30, 2021 ka ndị o ji egbe wakporo ụgbọala bu Ahmed Gulak na mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha na-eje ọdọụgbọelu Sam Mbakwe dị n'Owerri ị ga-abanye ụgbọelụ.
Etu e si gbuo Ahmed Gulak
O kwuru na mgbe Gulak na-ahapụ ụlọoriri na mkwarị ya akpọrọ Protea, na o nweghị onye uweojii ọ gwara maka enweghị ezi nchekwa dị n'Imo steeti ugbua.
O kwuru na o nweghị ndị ọrụ nchekwa so Gulak nakwa onye 'taxi' bu ya gbara ụzọ ọzọ ebe ndị omekome ruru isii bu ụgbọala kwụsirị ụgbọala ya ma hụ na ọ bụ ya nọ ebe ahụ, gbagbuo nanị ya.
Ha gbagburu ya n'ụzọ Umueze Obiangwu dị n'okpuruọchịchị Ngor-Okpala dịketere ọdọ ụgbọelu.
Bala kwuru na kọmịshọna ndị uweojii n'imo steeti bụ Abutu Yaro ekwuola ka e mee nyocha gbasara ọdachị a ma zipu ndị uweojii ka gechie ogbe ahụ ma nwụchie ndị omekome ahụ.
Ihe ndị ọzọ ịkwesiri ị ma maka Ahmed Gulak
Ahmed Gulak chịkọtara ọgbakọ mere ntụliaka ime ụlọ nke Imo steeti n'afọ 2019. Ọgbakọ ahụ họpụtara Hope Uzodimma na-achị Imo steeti ugbua na ntuliaka ime ụlọ APC Imo steeti mere n'afọ 2019.
Gulak bụbu onye enyemaka nakwa ndụmọdụ Goodluck Jonathan chiburu Naịjirịa.
O si na pati Peoples Democratic Party fegaa na All Progressives Congress n'afọ 2018.
Otu nwata nwaanyị ji aha Munerahaag wee nọrọ na twitter depụtakwara ozi a n'akara ya.
Na nso nso a, eweghị ezi nchekwa na-arị ibe ya elu na mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka ndị omekome na-emebesi ọtụtụ ngalaba gọọmenti etiti na steeti ahụ.
Ọnwụ Gụlak na-abịakwa n'oge ndị nọ na mpaghara ọwụwa na-eme ncheta Biafra bụ ụbọchị onye agha Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu kwuputere na Biafra ga-esi na Naịjirịa kewapụta na Mee 30.
Akụkọ na-abịa.