You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Rochas emerighi ntuliaka APC Imo West'
Ebilimmiri chịcha obodo, osimiri edere jụụ, mana ebilimmiri Imo steeti ajụla ịdajụụ.
Kemgbe a malitere ndọrọndọrọ imeụlọ APC n'Imo steeti, o doghị anya ihe ọnọdụ steetị ahụ ga-abụ n'ọdịnihu.
Kemgbe ụbọchị asaa nke ọnwa asatọ n'afọ 2018 ka aha Rochas Okorocha gbara na akwụkwọ akụ dị ka onye ga-ebuliri APC ọkọrọta ha na ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara Imo West.
Obi adịghị ọtụtụ ndị Imo steeti anyị gbara ajụjụọnụ mma maka mpụtara ya bụ ntuliaka.
Ichie Mbanaso bụ onye ruburu ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ Imo steeti maka mmepe ahịa sịrị mpụtara ahụ jụrụ akwụkwọ akụkọ maka Okorocha imeri ya "bụ ntuliaka imeọlụ bụ asị".
Ọ kọwara BBC Igbo ebe mmiri sị baa na ya bụ opi ụgbụghụrụ.
N'otu aka ahụ Oriakụ Mgbechi Onyekachi kwuru n'ụwa gbara ndị APC gharị n'Imo steeti ugbua.
Ọ sị na "o nweghị onye mazị ebe a kwụ akwụ".
N'uche ya, "Rochas emeghị ihe ekwekọrịtara na mbụ".
Gee ya ntị na olu.
BBC Igbo kpọtụkwara onye ọkaiwu dị elu bụ onye so na pati PDP maka ihe na-akpọtụ na Owerri.
Mike Ahamba (SAN) sị na ihe mgbawa obị na-eme na APC nke agaghị ekwe ya odidi.
Ahamba so na ndị mbụ sị APC gbafere na PDP.
Gee ya ntị n'olu.
Onye ndụmọdụ onyeisi PDP bụ Ike Ebonyi sị na ndị Imo ga-akwụsili ihe na-eme n'Imo ma ọbụrụ ha kwụsị ịla aka azụ.
Okwukwara na megharị a na-emegharị ntuliaka APC n'Imo steeti gosiri n'aka azụ dị na ya.
Ọ sịkwa na ime na anyị ndị Imo otu a na ndọrọndọro ọchịchị maka ha anaghị akwanyere otu esi eke ọchịchị na mpaghara na mpaghara ugwu dị ka ndị Steeti ọzọ.