Mmeri Atiku na ntuliaka 2019 ga-achịkọta Naịjirịa-Ụmụ Igbo

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Atiku abụghị nwata n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naijiria.

Ihe i kwesịrị ị maa maka Atịku

1. Ọ dị afọ 72

2. Ọ rụrụ na Kọstọm afọ 20 bụrụ osote onyeisi tupu ọ la ezumike nka na afọ 1989

3. O meriri dịka Gọvanọr Adamawa n'afọ 1998 mana a họrọ ya dịka onye ya na Obasanjọ ga-azọ ọkwa isiala dịka osote ya n'afọ 1999.

4. Ọ zọburu ka ya banye ọkwa onyeisiala ka Obasanjọ chịchara mana Obasanjo akwadoghị ya.

5. Inec kagbuburu aha ya ịzọ ọkwa onyeisiala n'ịzọ ọchịchị n'afọ 2006/7 mana ụlọikpe kachasị na Naijiria (Supreme Court ) kagburu ebubo ahụ.

6. Atiku agbaghariala na ọtụtụ pati.

O siri na PDP n'afọ 2014 banye na APC. O sikwara ebe ahụ lọghachi na PDP n'afọ 2017.

Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa na-akwado mmeri Atiku

Dịka Atiku Abubakar meriri na ntuliaka Imeụlọ PDP, ọtụtụ ekwupụtala obi ụtọ ha na mmeri Atiku Abụbakar gosiri na ọ ga-enwe mmeri na ntuliaka 2019.

N'ozi Atiku dere twitter, o kwuru na ọrụ kachasị dị mkpa ugbua bụ ka ụmụ Naịjirịa niile na-ebi ndụ dị mma, nwete ọrụ, na-akpata ego nakwa na-ebi n'udo n'ebe ọbụla masiri ha n'ala Naịjirịa.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na social media maka ya:

@unchantedspirit kwuru na Atiku ga-enwe mmeri na 2019 ma rịọ ya ka ọ ga n'Aso Rock me ka ọnụ ọchị tọọ ụmụ Naijiria nọ n'ihe mgbu ugbua.

@ojeeAgbons kwuru na ya na ezinaụlọ ya na-ekele Atiku maka mmeri ya ma kwuo na o nyela ha olileanya.

@richralph231 gosịrị ka obi dị ya dịka ọ nụrụ na ọ bụ Atiku na

@thinker9nija kwuru na ya ga-eji ike ya niile akwado Atiku.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị