You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Man City vs Chelsea: Etu o si akpọtụ ebe niile maka mmeri Chelsea
Uwa nile ekwetela na Chelsea bụ Eze bọolụ n'Iropu niile dịka ha ji otu ọkpụ goolu were merie ndị otu Manchester City n'asọmpị Champions League.
Nke a na-eme ya ugboro abụọ ndị otu Chelsea na-ebuli iko Champions League.
Nke a mekwara ya ugboro atọ Thomas Tuchel na-anyụ Pep Gurdiola ịkpakụ kamgbe ọ nọchịri Frank Lampard dịka onye nkuzi otu Chelsea.
Ọ bụ Kai Havertz nyere ya bụ otu goolu dịka ọ fọrọ elekere atọ ka emechie agba nke mbụ na ya bụ asọmpị.
Dịka o siri dị, ọṅụ juputara ndị nkwado Chelsea niile.
Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka nturuugo otu Chelsea
@PeterPsquare - " Kedụ ndị bụ Eze Iropu?"
@Van_Clasher kwuru sị, " Konte mụọ amụ, ụwa niile a bụrụ sọ aṅụrị. unu abọọla chi"
@Teewalayo sị, " Nke a bụ nkarị, obi dị mụtọ na m na-akwado Chelsea."
@ay_Dauda - "Ọtụtụ ndi mmadụ yi uwe ndị chelsea bịa ekpere na Mosque ụtụtụ a"
@comrade_love - "Abalị satụde gosiri na Ngolo Konte bụ dike"
@Saintcarter6 - " Chelsea nke m"
@EastonDavis8 - " Ka chi foo Chelsea, Daalụ nụ"