You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Operation Restore Peace: Ụnụ anọla nkịtị ka ndị ekperima na-awakpo ụnụ, burunụ ụzọ gbuo ha - IGP Alkali Baba
"Ụnụ anọla nkịtị na-eche ka ndị uweojii wakpoo ụnụ, burunu ụzọ wakpoo ha ma gbukpọọ ha."
Nke a bụ ndụmọdụ onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba nyere ndị uweojii na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị Tuzde.
- Insecurity in Southeast Nigeria: Ebe niile awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Abia, Anambra, Ebonyi, Enugu na Imo steeti
- 'Ihe kpatara agha Biafra amalitela ime ọzọ ugbua'
- Nkata ọhụrụ ndị Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na-akpa maka nchekwa
- Ọ bụghị eziokwu na a napụrụ ndị ọchịchị Ọwụwa Anyanwụ ndị uweojii na-eche ha nche - Uweojii Delta Steeti
Alkali Baba nyekwara ndị ọrụ ya iwu ka ha ghara ị na-agbara ndị ekperima ọsọ, maọbụ gbachi nkịtị ka a na-anakọrọ ha egbe.
O kwuru nke a n'Enugwu n'Tuzde n'emume iwepụta amụma ọhụrụ a kpọrọ "Operation Restore Peace" nke ọ mapụtara maka ịweta udo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ntụziaka na-abịa dịka akụkọ ndị ji egbe na-awakpo ogige ndị uweojii nakwa na-egbu ndị uweojii na-arị ibe ya elu n'Ọwụwa Anyanwụ.
Alkali Baba, onye kwuru na oge eruola ka ndị uweojii ga-ebu agha gaa n'ọnụama ndị ekperima gwara ndị ọrụ ya sịrị,
O kwuru sị: "Ị gaghị ejide ngwa ọgụ ghara ịma ka esi echekwa ọnwe gị. Were ngwaọrụ gị chekwa onwe gị."
"Gbachị nkịtị ihe ndị ntaakụkọ na'ekwu, meenụ ihe m nyere ụnụ n'iwu."
"Buru ụnụ ụzọ buso ha agha ebe ọbụla ha nọ ma gbuchaa ha dum."
"Onyeisiala enyela iwu ka ụnụ gbatuo onye ọbụla ụnụ hụrụ AK47 n'aka ya, ikike ọzọ ka ụnụ na-eche?"
"Anyị kwesịrị ichekwa ndị mmadụ mana ụgbua anyị enweghị ike ichekwa onwe gị, onye ka ụta dịrị.?"
"Ị na-achọ ke e nye gị ikike ịchekwa onwe gị, onye ga-enye gị ya. Nọrọ ebe ahụ na-eche ka ịbanye n'ime ili tupu enye gị ya.".
N'ọgbakọ ahụ, Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi kelere onyeisi ndị uweojii maka atụmatụ 'Operation Restore Peace'.
O kwere nkwa na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ kwadoro ihe ọbụla a ga-eme ka udo wee laghachi na mpaghata ahụ.