You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Dare Adeboye burial: Etu akwamozu Dare Adeboye si aga
A malitela akwamozu Ụkọchukwu Oluwadamilare Temitayo Adeboye (Dare) bụ nwa nke atọ nke Ụkọchukwu Enoch Adeboye bụ onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God (RCCG).
A na-aka ụka maka akwamozu ya n'ụlọ ọgbakọ ndị ntoroọbịa dị na RCCG Redemption Camp dị n'Ogun steeti.
A kachaa ụka a, a ga-eli ozu ya taa bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, 2021.
Dare a na-etu 'Pasto Dee' dị afọ 42 mgbe ọ nwụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee, 2021.