You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ipob/ESN List: 'Nelly Ofoegbu abụghị udi mmadụ anyị ga-asa okwu'
Kamgbe ụnyahụ ka akwụkwọ ebe e depụtara aha ndị otu Indigenous People of Biafra ekwuru na-erifusi ego ndị otu ahụ tụkatara.
Dr. Nelly Ofoegbu onye aha ya dị n'akwụkwọ ahụ wepụtara akwụkwọ ahụ na Facebook ya.
Mana Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu Ipob kwuru na onweghị ihe jịkọrọ Ipob na Nelly Ofoegbu makana ha achụọla ya dịka onye ọrụ ha kamgbe.
"Anaghị m asa asịrị ndị enweghi isi na-akọ, Ipob bụ ngalaba ama ama na mba ofesi." bụ ihe Powerful kwuru
"Ihe ọbụla ọ sọrọ ndị mmadụ kwuwe, ebe uche Ipob dị bụ n'inweta Biafra."
BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị aha ha dị n'akwụkwọ ahụ Ofoegbu tinyere na Facebook ya.
Etu e si nwụchie ndị e chere na-ere akwụkwọ mgbasaozi Ipob n'Owerri
Ndị echere na-ere akwụkwọ mgbasa ozi otu Indigenous People of Biafra(Ipob) kwuru na ndị uweojii puruiche a kpọrọ Intelligence Response Team si Abuja nwụchiri ndị otu ha ise.
Ha kwuru na ha biara n'isi ụtụtụ ebe elekere isii, kụọ ha egbe, maja ha, gbaa ha ọtọ, ma kpụrụ ha gawa ụlọọrụ ha.
Onye na-edowere ndị otu jịkọtara ndị niile na-ere akwụkwọ mgbasaozi n'Imo steeti ego bụ Somto Amaechi nọchitere anya Udofia Imoh bụ onyeisi ha kwuru na-atọghapụla ndị otu ha anọ, ọ ka fọdụ otu onye.
O kwuru na ndị uweojii ahu kwuru na ha agaghị atọghapụ otu onye ahụ fọrọ belụ ma ọ kpọpụtara ndị na-ezinye ha ịre akwụkwọ mgbasa ozi ahụ.
Amaechi kwuru na ndị uweojii ahụ boro ha ebubo na ha na-agbasa ozi otu a machịrị machịrị bụ Ipob mabụrụkwa ndị na-enye otu Ipob kepu kepu maka ihe na-eme n'obodo.
O kwuru na kamgbe abịara ịchọ ndị na-ere akwụkwọ mgbasa ozi akpọrọ "Biafra Times" , ha na ndị otu ha kwụsịrị ire ya bụ akwụkwọ.
Amaechi kwuru na ndị ahụ e tiri ihe nọ n'ụlọọgwụ ugbua a na-ata ọgwụgwọ maka ihe e tiri ha.
O kwuru na ndị uweojii ahụ pụrụiche gwara ha na mwakpo a ka bụ mbido makana ha ga-aga n'ọdọ ebe niile a na-ere akwụkwọ mgbasa ozi, nwụchie ndị nille na-ere akwụkwọ mgbasa ozi Ipob.
Ka ọ dị ugbua, ndị otu na-ere akwụkwọ mgbasa ozi nọ n'Imo steeti agbaala abụbụ ọrụ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Imo steeti bụ Orlando Ikeokwu kwuru ka akpọghachi ya mgbe BBC gbalịrị ịnụ olu ya maka okwu a.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: