You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ozubulu crisis: Ndị ọchịehi awakpoghi Ozubulu - Ndị uweojii Anambra steeti
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na o nweghi mwakpo ndị ọchịehi mere n'Ozubulu n'abali Fraide na ụtụtụ Satọde ụbọchị iri abụọ ọnwa Juun.
Ọnụ na-ekwuru ha n'Anambra bụ Tochukwu Ikenga kwuru na o nweghi ihe dị etu ahụ ha nụrụ maka ya.
Onye ọzọ bi n'obodo ahụ gwara BBC na o nweghi ihe dị etu ahụ mere.
O kwuru na ihe mere bụ na otu onye obodo tiri mkpu na ọ hụrụ ndị Fulani n'obodo ahụ.
Mkpu o tipuru mere ka ndị nche obodo zukoo ngwangwa ma malite ịche nche abalị rue ụtụtụ.
"Ndị na-akụ ekwe zisara ya n'ozi ka ndị mmadụ pụta bịa chee nche ka o kwuru".
Cheta na ndị ji egbe awakpoola ụlọọrụ ndị nche ma gbuo ihe a na-eche ruru mmadụ ise na mpaghara Ozubulu dị n'Anambara steeti n'ọnwa Mee
Ikenga Tochukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ndị omekome a mụnyekwara ma ụlọọrụ ma ụgbọala ndị nọ ebe ahụ ọkụ.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ hụrụ ụlọ ndị nche a gbara ọkụ nakwa ngwa obibi akpọrọ ọkụ n'obodo ahụ.
Onye hụrụ ebe ihe mere na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọ hụrụ ozu otu nwaanyị nakwa ụmụnwoke atọ n'ebe ahụ.
Onyeisi ndị nchekwa obodo bụ Jude Ononuju gwara BBC Igbo na ọ bụ mmadụ anọ nwụrụ na ya bụ ihe.
O kwuru na ndị ahụ gụnyere otu nwaanyị nakwa nwoke abụọ ha bụ ndị nchekwa obodo na-ekpe ikpe tupu awakpoo ha.
E chere na a wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii n'Ozubulu dị nso n'ebe ahụ.