Sheikh Gumi: Onye ka ọ bụ na ihe mere e ji kpụrụ ya n'ọnụ?

Onye bụdị Sheikh Gumi a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ?

Jewel Kiriungi dere ya

Aha Sheikh Gumi na-ewu ewu ugbua maka okwu banyere mmekọrịta ya na ndị ekperima 'bandits' na-atọrị ndị mmadụ.

Kemgbe ọnwa Jenụwari afọ 2021, Gumi ezutela ndị ndu ndị ekperima a ọtụtụ oge iji kwụsị ha ịkpa ike ọjọọ.

O zutere onyeisi ndị ntọrị tọọrọ mmadụ 42 gụnyere ụmụakwụkwọ na Niger Steetị mana a tọhapụrụ ha oge ha na Guni zutechara.

Nke mere na nso nso a bụ nne na nna ụmụakwụkwọ mahadum agriculture a tọọrọ na Kaduna sị na Gumi kpọtara nwoke naara ha ego dị puku narị asatọ (800,000), iji nyere ha aka gbapụta ụmụ ha.

Nke a mere ọtụtụ ndị mmadụ ji na-adọri Sheikh Gumi na soshal midia.

Onye bụ Sheikh Gumi?

  • A mụrụ Sheikh Gumi n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, afọ 1960 na Kano Steetị.
  • Ọ bụ ọkpara Sheikh Abubakar Muhmud Gumi bụ onye nkuzi alakụba nakwa ọkaikpe n'ụlọikpe Sharia site n'afọ 1962 ruo 1967.
  • Gumi gụrụ akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello ebe ọ gụrụ akwụkwọ ngalaba ahụike 'medicine'.
  • Ọ banyere n'ọrụ ndịagha na 'Nigeria Defence Academy' dịka onye dọkịta.
  • Gumi lara ezumike nka n'ọrụ ndịagha n'oge o ruru n'ọkwa 'captain' ma gaa na mba Saudi Arebia ịgụ akwụkwọ na mahadum Umm al-Qura dị na Mecca.
  • O nwetere ọkwa dọkịta na ngalaba agụmaakwụkwọ 'Philosophy' banyere mmụta n'okpukperechi alakụba.
  • Ugbua ọ bụ onye nkuzi akwụwkọ nakwa onye odeakwụkwọ n'ụlọokpukperechi Sultan Bello dị na Kaduna Steetị.
  • Gumi alụọla nwunye ma mụọ ọtụtụ ụmụ.

Okwu ya

"Ịtọrọ ụmụaka site n'ụlọakwụkwọ ha bụ obere ihe ọjọ maka n'ikpeazụ, gị na ndị ekperima ahụọ ọnụ ihe ị ga-akwụ, ugbua ndị ekperima na-akpachapụ anya maka ndụ ndị mmadụ. Oge mbụ, ebunmobi ha bụ ha bata obodo, ha aghasa ya gbuo ndị mmadụ." -Gumi, dịka ọ na-akwu maka ntọ ụmụakwụkwọ n'ọnwa Maachị afọ 2021.

" Abụghị m onye mbụ ya na ndị ekperima na-akpa. Naanị na o nwere ihe dị mma m gbakwụnyere. Anaghị m aga ahụ ndị ekperima na enweghị onye ọrụ gọọmenti soro m gaa." - Gumi dịka ọ na-ekwu na gọvanọ Kaduna na Zamfara steeti zutere ndị ekperima tupu ya onwe ya ezute ha n'ọnwa Maachị afọ 2021.

"Onye ọbụla ahụla na anyị na ndị a na-akpa ,na ha kwere nkwa na-a ha ga-awụsa ngwaọgụ ha nakwa ihe ha na-eme, na mụ onwe m kwere nkwa izute onyeisiala maka nke a." Gumi dịka ya na BBC Hausa nwere mkparịtaụka n'ọnwa Febụwarị, afọ 2021.

"Ọtụtụ n'ime ndị agha aka ha dị na mkpamkpa na-akpa abụghị ndị ụka Alakụba. Ị ma na e nwere ndị agha bụ ndị Ụka Alakụba na ndị abụghị. Ndị abụghị ụka Alakụba bụ ha na-ebute nghọtahie iji bute ọgbaghara."- Gumi dịka ọ na-agwa ndị ekperima okwu n'ọhịa Tegina dị na agbata Niger na Kaduna steeti, ọnwa Febụwarị 2021.

"Ọ bụrụ na Naijiria nwere ike ịgbaghara ndị kpara nkata iweghara ọchịchị n'ike n'oge ọchịchị ndị agha, the ekperima nwere ike inwetakwa ụdị mgbaghara n'oge ọchịchị ndị nkịtị." - Gumi dịka ọ na-asa otu jịkọrọ ndị ụka Kraịstị na Kaduna n'ọnwa Maachị,afọ 2021.

Ihe ndị ọzọ na-ekwu maka Gumi

"Oh Ahmad Gumi, ugbua, ị na-agagharị, na-agwa ndị Fulani okwu, ma chee na ị na-agara Chukwu ozi… Ị ji Koran agbasaozi ọchịchị onyekwuoucheya. Maka gịnị?" - Abubakar Shekau, onye ndu otu Boko Haram, n'ọnwa Maachị, afọ 2021.

"Ya mere, ọ bụ ihe jọgburu onwe ya na onye ọnụ na-eru n'okwu [Sheikh Gumi] ga-ama ụma na-akatọ ndị Agha Naijiria." Ọnụ na-ekwuru ndị Agha Naijiria bụ Mohammed Yerima, n'ọnwa Maachị 2021.

"Naanị ịgbaso ụzọ iwu na-iso Sheikh Gumi bụ ụzọ ndị Agha Naijiria ga-eji egosi ihe e ji mara ha n'ezie." - Emmanuel Onwubiko,,onye nchịkọta otu 'Human Rights Writers Association of Nigeria (Huriwa) n'ọnwa Maach afọ 2021.

"Kedụ ka anyị ga-esi amata n onye na-ebo ebubo na ọ bụ ndị agha bụ ndị otu ụka Kraistị bụ ndị na-awakpo obodo na ndị ekperima? Shikh Gumi ọ chọrọ iji okpukperechi kewaa ndị Agha Naijiria?" -Joseph Daramola,Odeakwụkwọ Ukwu otu 'Christian Association of Nigeria' (CAN) n'ọnwa Maachị, afọ 2021.

"Anyị niile nọ ebe oge otu nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchụkwụ ụka Alakụba [Sheikh Gumi] ji nọrọ n'ihu igwe onyonyo, na-aga n'ọhịa dị n'Ugwu Awụsa ebe ọ na-ezute ndị okorobia ya- ndị ekperima- mana o nweghị ihe e mere ya." Chukwuemeka Alozie, onye mgbasaozi, Radio Biafra n'ọnwa Maachị 2021.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: