You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Desmond Elliot News: Ihe mere e ji adọrị ya ka kanda na Social Media
Ọ na-atụ n'anya etu ọtụtụ ndị ntoroọbịa ọkachasị na Soshai midia ji kpụrụ omee ihe ejije Nollywood bụ Desmond Elliot n'ọnụ.
Ma ihe gbasara ya ma nke na-agbasaghị ya, ihe ọbụla mere bụ ihe ọdachị, a ga-ebo ya nwaamadị a.
Kedụ etu ya bụ ihe siri bido?
Desmond Elliot onye banyere dịka onye omeiwu nke Legọs steeti na-anọchite mpaghara Surulere n'afọ 2015.
Kama ọ bụ dịka o kwuru okwu n'ọnwa Oktoba afọ 2020 were sị ka ehiwe iwu ga-ewepụta usoro ịnyocha etu ndị mmadụ si ekwu okwu na Soshal Midịa.
Ọ bụ dịka a na-eme ngagharịiwe Endsars ka Elliot kwuru okwu maka iwu ga-ahazị ma nyochaa mmekọ na soshal midịa nke bụ Social Media Bill n'okwu bekee.
Nke a kpalịriiwe ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị ntoroọbịa.
Kama Elliot na-ekwu na ha họtagherịrị ya.
O kwuru sị, " A na m arịọ mmadụ niile maka na akụkọ a abụghị eziokwu.
Enweghị ụlọomeiwu steeti ọbụla nwere ikike ibido atụmatụ dịka ịhazị usoro mmekọ na soshal Midịa".
Elliot kwuru na ihe ọ na-akọwa bụ ndị niile ọnụ na-eru n'okwu ka ha kwụsị ibute ekworo mgbe ha na-edepụta ihe na soshal midịa.
Na-agbanyeghị nkọwa ya, ndị mmadụ ekweteghị.
Gịnị mere eji kpụrụ ya n'ọnụ ọzọkwa nsonso a?
Ọtụtụ ndị ntoroọbịa ka kwenyere na Elliot mejọrọ ha ma ha achọghị ịgbahara ya.
Ọtụtụ na-ekwu na Elliot anaghị achọ maka ọdịmma ndị ntotoọbịa maka ihe o kwuru n'ụlọ omeiwu maka ịhazị soshal Midịa.
E ji ya eme ihe akaja iji gosi iwe ha.
Lee ụfọdụ ihe na-agbasaghị Desmond Elliot ha were konye ya n'isi iji gosi iwe ha.
Kedụ onye bụdị Desmond Elliot a a na-adọ ka anụ kanda?
A mụrụ Desmond Elliot n'ụọchị anọ nke ọnwa Febụwarị, afọ 1974.
Ọ bụ onye obodo Olowogbowo nke Lagos Island.
O lụrụ nwaanyị ma ha mụtara ụmụ anọ.
Ọ bụ onye na-eme ihe ejije Nollywood tupu ọ banya na ndọrọndọrọ ọchịchị.
O mere ịnọchịte anya okpuru ọchịchị Surlere Legọa steeti n'afọ 2015.