You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
27 Years Bill and Melinda Gates Marriage: Ha agbaala alụkwaghịm ka afọ 27 gachara
Bill na Melinda Gates agbaala alụkwaghịm ka ha lụchara di na nwunye ruo afọ iri abụọ na asaa.
"Anyị agaghị etolizi dịka di na nwunye," " Anyị echela nakwa ezigbo ọrụ anyị tinyereala na mmekọrịta anyị, anyị e kpebiela ka anyị ka anyị gbasaa dịka di na nwunye," dịka ha si depụta na twitter.
Ha bụ ụzọ hụ onwe ha n'afọ 1980 mgbe Melinda batara n'ụlọ Microsoft nke Bill.
Ha abụọ nwere ụmụ atọ ma na-ahazịkọta ngalaba Bill & Melinda Gates Foundation ọnụ.
Ngalaba ahụ etinyela ego ijeri kwuru ijeri n'ibuso ọrịa na-efe efe ma na-arịọ ka agba ụmụaka ọgwụ mgbochi.
Ndị bee Gate na onye azụmahịa akpọrọ Warren Buffet so na ndị hibere " Giving Plegde" na-akpọkụ ndị nwere ọtụtụ ego ka ha jiri akụ na ụba ha mepụta ihe ọma.
Gates kpatara ego ya mgbe ya na onye ọzọ chopụtakọrọ ụlọọrụ Microsoft n'afọ 1970.
Etu ịhụnanya ha si malite
Melinda dị afọ iri ise na isii malitere ọrụ na Microsoft dịka onyeisi ngwa ahịa n'afọ 1987.
Ha abụọ mechara nọọkọọ otu tebulu n'otu emume ndị azụmahịa mere na New York n'afọ ahụ.
Etu ahụ ka ọyị ha si malite mana Bill gwara otu ụlọọrụ akpọrọ 'Netflix documentary' na ha abụọ hụrụ onwe n'anya nke ukwuunke bụ na naanị otu n'ime ihe abụọ nwereike ime. Nke mbụ bụ na ha nwerike itasa maọbụ lụọ onwe ha.
Ha mehara lụọ onwe ha n'afọ 1994. Bill dị afọ iri isii na ise mechara rituo dịka onyeisi Microsoft ka o wee gbadoo anya n'ihe ndị gbasara inyere ndị mmadụ aka.
Gịnị bụ Gates Foundation?
Di na nwunye a hibere ngalaba Bill na Melinda Gates Foundation n'afọ 2000 na Seattle.
Ngalaba ahụ gbadoro anya na ahụike, agụmakwụkwọ nakwa ihe gbasara mgbanwe ihu igwe.
Ha wepụtara ego ruru dọla otu Ijeri maka atụmaatụ ọgwụ mgbochị ọbụla nakwa nyocha maka covid 19.
Bill na Melinda Gates wụnyere ego ruru $36bn na ngalaba Bill na Melinda Gates Foundation site n'etiti 1994 na 2018.