You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Don Jazzy Married: A lụrụ m nwaanyị mgbe m dị afọ 20, mana anyị gbasara oge m dị 22
Oti egwu Michael Collins Ajereh a ma dịka Don Jazzy ekwuputela etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ ka na-amalite okorobịa.
Don Jazzy dị afọ 38 ugbua kọwara etu o si lụọ nwaanyị mgbe ọ dị naanị afọ 20, mana ha gbasara ka naanị afọ abụọ gachara.
O wepụtara foto agbamakwụkwọ ya n'elu Instagram ya iji saa ajụjụ ndị mmadụ na-ajụkarị ya gbasara mgbe ọ ga-alụ nwaanyị.
O kwuru na ha malitere inwe okwu n'alụmdinanwunye ha maka na ọ bịara buru ihe gbasara iti egwu n'isi ya.
O kwuru na ọ ka bukwu ihe gbasara mmepụta egwu ya n'isi, nke bụ na ọ na-atụ ụjọ na ọ ka nwere ike ịghasa alụmdinanwunye ọzọ ma ọ bụrụ na ọ lụọ nwaanyị ọzọ.
O kwuru na ọ ga-eji nwayọ nwayọ na-eme ihe gbasara ime ọyị nakwa ịlụ nwaanyị.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka alụmdinanwunye Don Jazzy:
Omoissy kwuru na ọ bụ ihe ịtụ n'anya na Dbanj na Wande Coal ekwuputaghi maka ya n'agbanyeghi esemokwu ha nweburu butere mgbasa ha.
Dayo Ashiru kwuru na enweghi onye Don Jazzy ji ụgwọ nkọwa ihe gbasara ndụ ya.