You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
South East Security : Onitsha Ado Vigilante Unit na ihe i kwesịrị ịma maka ya
Obi nke Onitsha bụ Igwe Nnaemeka Achebe nọọrọ n'ọnwa Febụwarị afọ 2021 kpuhee otu nchekwa ọhụrụ nke obodo ahụ a kpọrọ 'Onitsha Ado N'Idu Vigilante Unit'.
E hiwere otu nchekwa iji gbaa mgba megide mpụ, ohi nakwa ihe ndị arụ ndị ọzọ metụtara nchekwa n'obodo Onịcha na gburugburu ya.
E bunyere ha ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ ga-enyere ha aka ichekwa obodo ọfụma.
Ihe i kwesịrị ịma maka 'Onitsha Ado N'Idu Vigilante Unit'
- E hiwere otu a n'usoro iwu na-achịkwa otu nchekwa n'Anambra Steetị bụ 'Anambra State Vigilante Services' dịka e depụtara n'akwụkwọ ozi 'Onitsha Foundation Newsletter'.
- Mmadụ iri itoolu na otu natara ọzụzụ mbụ isonye n'otu nchekwa a.
- Ha natara ọzụzụ n'aka 'Anambra State Vigilante Services' nakwa ndị uweojii.
- A zụrụ ha na usoro ime iihe dị iche iche gụnyere; ịlụ ọgụ, inweta ozi pụrụiche zoro ezo nakwa ime nnyocha, mmụta ikike dịrị onye dgz.
- Site n'ọzụzụ ndị 'Anambra Vigilante' nyere ha, ha nwere ikike ibu egbe nga ọgụ.
- Ndị kwadoro ọzụzụ nakwa ihiwe otu nchekwa a gụnyere gọọmentị Anambara Steetị, ndị uweojii nakwa ndị Eze ọdịnala Onicha.
Ihe na-eso nhiwe otu nchekwa
Ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere Nnamdi Kanu bụ onye ndu Ipob etinyela ọnụ n'okwu ihiwe otu nchekwa Onitsha Ado Vigilante Unit.
Kanu sị ka Igwe Achebe ekwela ka e were ọkwa ya bute nsogbu nye ndị Eastern Security Network bụ nke Kanu n'onwe ya hiwere.
Ọ sị ma ọ bụghị ya na Igwe Achebe na ndị otu ya ga-ebe akwa.
Mana ndịisi otu a e meela ka ọ ha mata na ihe e jiri hiwe ha bụ maka ọdịmm ndị obodo Onitsha na gburugburu ya.
Na o nweghi ihe ọzọ ma ọ bụghị naanị ibuagha megide mpụ, ohi, ntọrị n'oge a ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ n'Ọwụwa Anyanwụ.