You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Asari Dokubo, Uche Mefor na Uwazuruike ehiwela otu Biafra ọhụrụ
Otu kpọrọ onwe ya 'Biafra De Facto Customary Government' ahọpụtala Asari Dokubo dịka onyeisioche kọmiti ga-ehibe otu a.
Nke a pụtara ihe na nzụkọ nke otu ahụ na-achọkwa nkewapụta Biafra mere n'ikuku na mgbede ụbọchị Satọde.
N'ozi mbụ o ziri n'ọkwa, Dokubo kwuru na "anyị bụ ndị Biafra ekpebiela iji aka anyị weghara akaraaka anyị ma nwetara onwe anyị na ụmụ anyị nnwereonwe"
Ọ jụrụ sị, "Ruo ole mgbe ka anyị ga-agbachị nkịtị ka e jiri ike bata ala anyị na-achịgharị anụmanụ ha?"
"Ruo ole mgbe ka steeti Zamfara ga-enwe ikike ịgwuputa ma jide ọlaedo na ihe ndị ọzọ nke ha mana anyị enweghi ụdịrị ikike ahụ?"
O kwukwara na ndụ a ọ na-ebi ejughi ya afọ, nakwa na ọ gaghị ewetu onwe ya n'ebe onye ọzọ nọ.
Na ngwụcha o kwuru si "onye echeghi na o nwere ihe dị njọ n'ịbụ onye Biafra n'ihi na o nweghi ihe ka ihe anyị na-agabiga taa na Naịjirịa njọ"
Kedụ otu bụ "Biafra de Facto Customary Government"?
'Biafra de Facto Customary Government' bụ otu na-achọ nnwereonwe Biafra dịka aha ha si gosi.
E cheere na ọ bụ otu nke Asari Dokubo, Ralph Uwazurike, nakwa nke Uche Mefor bịakọtara ọnụ hibe.
Lee ndị ji ọkwa dị icheiche n'otu ahụ
- Asari Dokubo - Onyieisioche Kọmiti ga-ehibe otu a
- George Onyibe - Onye odeeakwụkwọ
- Uche Mefor - Onye odeeakwụkwọ mgbasaozi
- Emeka Esiri - Onye ọkaiwu otu ahụ
Ha kwuru na ihe kacha ha mkpa ugbua bụ nchekwa mpaghara ha dịka okwu nchekwa jisike emebi kwa ụbọchị na Naịjirịa.