You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụdịrị ọchichị e nwere na Naịjirịa kpatara na ezi nchekwa adịghị - Charly Boy
Charles Oputa eji charly Boy maọbụ Area Fada mara ataala ụkwa jaa eze na mkaparitaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị nke 15 nke ọnwa Maachị bụ Monde.
Na-ịza azịza banyere enweghi nchekwa na mpaghara Naịjirịa dị iche iche, Charly boy katọrọ ọchịchị nọ ugbua n'ebe ọdị ukwuu. Ọ hụtara ya dika ọchịchị nchigbu. Ọ sị na ọ dika ọchịchị ngwere na achị.
Okwenyere na ihe na-eme egbua n'ala Naịjirịa mekwara mgbe gboo gbanye na nke ugbua ka njọ.
Ọ sị na ọ bụ na ndị fọnfọnju akpa juru n'oche.
Kirie etu okwu ya siri kwụrụ n'ebe a:
N'itinye ọnụ n'okwu a banyere enwepụta Asari Dọkubọ dịka onyeisioche ọgbakọ ọhụrụ a kpọrọ "De Facto Biafra Customary Government", Charly Boy kwuru na okwu ahụ bụ akụkọ idunọba. Gbanye na ọtụtụ ihe na-eme n'ala Naịjirịa bụ nke eji egwu okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'okwu metutara IPOB na otu nchekwa mpagara southeast a kpọrọ "Eastern Security Network" (ESN), Charly Boy kwuru na onye ụlọ ya na agba ọkụ anaghị achụ oke.
Ọ sịkwa na ebe ndị Ọdịda Anyanwụ nwere otu a kpọrọ Amotekun, ndị Ugwu e nwee nke ha . Ọ sị na ọ bụghị ihe ọjọ ndị Ọwụwa Anyanwụ inwe otu nchekwa ESN.
Ojikwara ohere a dụọ ndị ntoroọbia ọdụ .