Abia State Underdevelopment: Ọ bụrụ na ụzọ anyị dị mma, nwa m nwoke agaghị anwụ - Ndị Abam Arochukwu

Aha onyonyo, Rural Infrastructure: "Ọ bụrụ na ụzọ dị mma na be anyị, nwa m nwoke agaraghị anwụ"

Ndi Inya Abam bụ obodo dị n'okpuru ọchịchị Arochukwu n'Abia Steeti,

Ndị obodo a etiela mkpu etu ahụhụ si echi ha ọnụ n'ala, n'agbanyeghị na ha nwere ndị na-anọchite anya ha na gọọmentị.

Otu nwaanyị kọọrọ BBC Igbo etu nwa ya si nwụlahụ ya n'ihi na ha enweghị ụlọọgwụ ọbụla na be ha, okporo ụzọ e si aga ụlọọgwụ nke dị n'obodo ọzọ, adịghị mma.

Ndi Inya Abam, enweghị okporo ụzọ, ha enweghị mmiri ọṅụṅụ, ha enweghị ihe ọgbara ọhụrụ ọbụla e ji enyere ndụ aka.

Lee ihe anya BBC hụrụ n'obodo Inya Abam.

Ndị mere akụkọ a bụ Adline Okere, Vining Ogu na Chris Okereke.