Alor o nwere Igwe abụọ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndọrọndọrọ onye bụ Eze n'obodo Alor dị n'okpuru ọchịchị Idemili Sawụt nke Anambara steeti na-akọtụ n' obodo ahụ ugbua.

Mmadụ abụọ, MacAnthony Okonkwo na Ebelechukwu Chukwumesili, bụ ndị na-asị na oche Igwe Alor bụ nke ha.

Dịka ihe onyonyo o tinyere na sochal midia siri kọwaa, MacAnthony Okonkwo sị na o ya bụ ezigbote Igwe Alor.

Okwu a malitere dịka aka na-achị Anambara steeti bụ Willie Obiano nyere Eze ọdịnala 13 ezumike nwa mgbe nta makana ha soro Maazị Arthur Eze ga-ileta Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja.

Igwe Okonkwo sọ n'ime Igwe ndị a.

O mechara mee ihe onyonyo ebe ọ rịọrọ Gọvanọ Obiano arịrọ.

N'ụbọchị 18 nke ọnwa Ọctoba 2020 akụkọ pụtara na ndị Alor achụọla Igwe Okonkwo ma mee Maazị Chukwuemesili Igwe.

Akukọ ahu kwuru na Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige so gaa echichi ọhụrụ a.

Gọvanọ Anambara mechara wepụ ezumike nwa mgbe nta ahụ o tinyere ndị Igwe ahụ, gụnyere Okonkwo.

Mana,ụfọdụ mmadụ, dịka akụkọ dị n'ụlọ ntaakụkọ Vanguard siri dee, anabataghị atụmatụ ahụ.

Mana ka ọ kwụ ugbua, Okonkwo ka na-ekwusi ike na ọ bụ ya bụ Igwe n'Alor.

N'ihe onyonyo o mere, o kwukwara na ọ bụ ya bụ otu Igwe e nwere n'Alor ma kwuo na gọọmentị Anambara kwụ ya n'azụ.

Dịka ọ kwụ ugbua, ọ na-ada ka e nwere Igwe abụọ n'Alor.

Akụkọ ka na-abịa.