You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Voting in Ghana: Nana Akufo-Addo nke NPP, John Mahama nke NDC, onye ga-emeri ntuliaka nke 2020?
John Mahama nke pati 'National Democratic Congress' (NDC) na Onyeisiala Nana Akufo-Addo nke 'New Patriotic Party' (NPP) anatala amụma e buru n'isi ha, nke kwuru na ha ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Gana a ga-eme n'ụbọchị asaa nke ọnwa Disemba 2020.
Onye amụma Nigel Gaisie bụ onyeisi ụlọụka a kpọrọ 'Prophetic Hill Church', buru amụma maka ya bụ ntuliaka, kwuo na "mgbanwe na-abịa".
Gaisie a ma ama n'ihi oke amụma ya nke ọ na-akpọkarị "Jesus agenda", kwuru sị na ọ bụ Mahama bụbu onyeisiala mba Gana ga-emeri ntuliaka nke afọ 2020 a.
Gaisie dere na Facebook ya n'ime ụbọchị ole na ole gara aga sị:
"Ntuliaka 2020 kwesịrị ka e jiri ime mmụọ nakwa ịgbado anya soro ya, ka pati na-ama aka gbado anya sị...*ANYỊ GA-AKỤSASỊ IHE HA JI BIRI* ANYỊ AGAGHỊ AHAPỤRỤ HA ỌCHỊCHỊ ETU AHỤ KA CHINEKE KWURU".
Ọ dọrọ ndị pati na-ama gọọmentị nọ n'ọchịchị aka ka ha kpachara anya, kwuo na ntuliaka a ga-abụ igwe na ọbara.
Onye amụma Gaisie na-ahụta na ndị NDC ga-emeri ntuliaka a, mana pati nọ n'ọchịchị bụ NPP agaghị achọ ịpụ n'ọchịchị.
N'ebe mbido afọ a, o buburu amụma na Donald Trump ga-emeri ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Amerịka nke ugboro abụọ n'afọ 2020.
Onye amụma kwuru na Akufo-Addo ga-emeri
Mana, Reverend Owusu Bempah bụ onye ụkọchukwu ọzọ kwuru na Onyeisiala Akufo-Addo ka ga-azọta oche ya ọzọ ma chịrị gaa n'ihu.
N'ịsa ajụjụọnụ ndị ntaakụkọ Net2TV gbara ya, Bempah kwuru sị na Onyeisiala Akufo-Addo bụ onye na-efe ọkọlọtọ NPP, ga-emeri ntuliaka 2020, ma kwuo na amụma ọbụla na-ekwu na ọ bụ Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha.
"Eji m obi umeala na-agwa ndị Gana ka ha mara na ihe m hụrụ bụ na Nana Addo ga-emeri ya bụ ntuliaka.
Mgbe ọ dị ka o ruwela oge ntuliaka oche ahụ kwesịrị ịtọgbọrọ chakoo n'ihi na ndị a na-achị na-akwado ịhọrọ onye ga-achị ha, mana nke Gana atọgbọghị chakoo, onyeisiala ka nọ n'elu ya."
O kwuru sị na amụma ndị ọzọ ndị ụkọchukwu na-ekwu na John Mahama ga-emeri bụ ezigbote ụgha. "M na-ekwu naanị ihe a e kpugherela m", ka o kwuru.
N'ime ihe niile a, amụma ndị a abụghị ejechaa ọ gwụ, dịka ndị Gana na-akwado ime ntuliaka ụbọchị Mọnde bụ asaa nke ọnwa Disemba, ebe ha ga-ahọpụta onye ga-emeri na onye ga-abụ onyeisiala mba ha, nke a ga-edu n'iyi ọrụ n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị.
Akụkọ ga-amasị gị: