Aka akparala onye uweojii gbara Joy Ndubueze egbe n'ọnụ
Aka ndị uweojii Legọs Steetị akparala onye otu ha ji egbe gbajasịa enyi ya nwaanyị ọnụ n'ihe dịka izuuka abụọ gara aga.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs steeti bụ Olamuyiwa Adejobi gwara BBC na ya bụ nwoke nọzị na mkpọrọ ndị uweojii esi rọọdụ n'ime.
Ana Ndubueze bụ nne Joy Ndubueze kwara arịrị etu ọyị nwoke nwa ya nwaanyị si were egbe gbarie nwa ahụ ọnụ.
Ha mere ka BBC Igbo mata na nwoke a bụ ọyị Joy bụ onye uweojii.
Na ọ kpọọrọ Joy gaa n'akụkọ ebe ndị mmadụ na-anọghị ma were egbe ka ọ gbagbuo ya.
Mana ekwentị Joy kụrụ, ka Joy sị ka ọ zaa ya egbe ahụ bịara gbaa ya n'ọnụ ma gbarie eze, ire na agba ya.
Joy dara n'ala, nwoke ahụ gbaa ọsọ mana ndị mmadụ bịara buru Joy gawa ụlọọgwụ.
Kirie ihe mere n'uju.
Akụkọ ndị ga-amasị gị: