You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ejike Mbaka: 'Ndị iro m akpaala nkata igbum ma mechie Adoration ministry'
Ụkọchukwu ama ama n'elekọta Adọration Ministry Enugwu bụ Fada Ejike Mbaka etiela mkpu na ụfọdụ ndịọrụ ya esorola ndị iro ya kpachaa nkata ka ha gbuo ya ma mechie ekpere Adoration na Aqua Rapha.
Mbaka malitere tibe ya bụ mkpu kamgbe izu ụka atọ ugbua n'ihi na, dịka o siri kwuo, ọ chọrọ ka ụwa nụrụ olu ya.
Mbaka kwara arịrị a n'okwuchukwu o kwuru na ụbọchị Wenezde abalị iri atọ nke Sepụtemba nakwa okwuchukwu ya na ụbọchị ụka, abalị anọ nke Ọkụtoba.
O kwuru na ndị iro gbara ya gburugburu, wee rịọọ ndịụka ka ha kpewere ya ekpere n'ihi na ọnwụnwa karịrị ya ahụ.
O kwukwara na ya nụrụ ebe a na-agbaizu etu a ga-esi gbuo ya ma mechie ụlọ ekpere ya; tinyekwara ozi ekwentị a na-ezitere ya sị ya kwadowa ọnwụ ya.
Mbaka kwukwara na ya agwala gọvanọ Enugwu bụ Ifeanyi Ugwuanyi nakwa ndị uweojii ihe na-eme.
O kwuru na ebe ọ nọ na-ewute ya nke ukwuu bụ na ụfọdụ ndị nọ ya nso na ndịọrụ ya so akpa ya bụ nkata.
Cheta na n'afọ 2002, mmadụ iri na anọ nwụrụ na Adoration Enugwu, oge ndị amaghị ndị ha bụ wakporo ndị bịara ekpere.
Nke a kpatara ọgbaaghara ji daa, nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị ahụ.
Ọzọkwa, Mbaka ekwubuola n'oge gara aga na ndị ekperima wakporo ya ọtụtụ oge ma gbaa ya egbe, mana ọ nwụghị
Ọ bụ nke a mere o ji tie egwu dịka nke ọ kpọrọ "A na-egbu achara, ọ na-eto" nakwa "ike m kwo aba mba"
Ụbọchị ụka gara aga ka Mbaka nọkwa kwuo na aka ndị Uweojii akparala otu nwa okorobia onyeọrụ ya chọrọ igbu mmadụ na Adoration ka o wee konye ya okwu n'isi.
Mbaka gwara ndị niile na-akpa nkata ọjọọ ahụ na o nyere ha otu izuụka ka ha chegharịa bịa rịọọ mgbaghara tupu iwe chineke ezute ha n'uju.
Mbọ niile BBC gbara iji nụta n'ọnụ ndị uweojii Enugu kpụrụ n'ala makana ma ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Daniel Ndukwe nakwa Kọmịshọna ndị uweojii bụ Ahmad Abdulrahman, azaghị ekwenti ha.
Ihe nkiri a ga-amasị gị