Liverpool akwọọla Arsenal ka awarawa tomanto

Liverpool na Arsenal

Ebe foto si, Getty Images

Liverpool egosila Arsenal mbe abụọ nke bụ oke oge ha ji ọkpụ goolu atọ a satara otu merie ha n'abalị Mọnde.

Cheta na Arsenal bu ụzọ merie Liverpool oge ha abụọ zutere n'asọmpi Community Shield na mmalite afọ ọhụrụ 2020/2021

Mana Liverpool kọwaara ha na anụ gbalaa taa echi bụ nta.

Arsenal bu ụzọ nyete goolu oge Lacazette nyere gollu na nkeji nke mbụ.

Mana oteghi aka tupu Sadio Mane asaa goolu ahụ, Richrdson etinye ya mmezi.

Na agba nke abụọ ka Liverpool nyetere goolu nke atọ iji gbagoro n'elu Tebulu EPL.