Eji m N5,000 azụta ikuku 'oxygen' kwa ụbọchị - nwaanyị na-enweghi ike iku ume

Ị gwa mmadụ na o nwere onye dị ndụ na-azụta ume ọ na-eku, ụfọdụ agaghị ekwe.

Mana ọ bụ ihe otu nwaanyị achọghị ka a kpọọ ya aha a ma dịka "Nwachukwu" na-agabiga.

Mgbe BBC gara gbaa ya ajụjụ ọnụ gbasara ọnọdụ ya, o ji anya mmiri na obi mgbawa kwuo sị "Chineke nyere m aka gabiga ọnwụnwa a"

I lee ya anya n'ahụ ị ga-ahụ na akpụkpa ahụ ya na-eji oji mana ihu ya na-acha ọcha, ị ga-anụkwa mkpọtụ igwe nkutu ụme nke o ji eku ume.

Ọ bụ mgbe ọrịa rịara m ka ndị dọkịta gwara m zụta nke ya bụ igwe nkutu ụme maọbụrụ na m chọọ ịdị ndụ.

Ọ zụrụ nke mbụ N650,000 mana a na-edozi ya ugbua.

Ọ zụrụ nke abụọ bụ N350,000.

Ọ zụkwara nke ejighi ọkụ latrịk arụ ọrụ bụ N65,000 ma jiri kwa N15,000 zụta 'oxygen'.

Ọ zụkwara nke a na-akwọ n'azụ ka nwa ọhụrụ bụ N200,000 maka mgbe ọ ga-eji chọọ ịpụ apụ.

"E nwere m dọkịta anọ na-agwọ m ọrịa a, a na m emefu N70,000 kwa ọnwa.

"Aha ọrịa m na-arịa bụ Pulmonary hypertension, nke na-eme ka ọbara ghara ịrụ mkpụrụ obi ka o si kwesi" ka Nigerian Goddess kọwara.

Ọrịa ahụ malitere ị rịa ya mgbe ọ dị naanị afọ atọ "akpụkpa ahụ m bu ụzọ gbajie oji tupu e mee nyocha chọpụta aha ọrịa ọ bụ" ka o kwukwara.

"Ụfọdụ ndị dọkịnta gwara m na enwere m ike ịgbake n'ọrịa a mana ụfọdụ gwakwara m na m ga-aṅugide ọgwụ rue ọnwụ m."

Nwaanyị a kọwara na di ya chụrụ ya na ụmụ ise ya maka ọrịa a.

O kwukwara na ọ dịghịrị ya mfe ị kwụrụ ha ụgwọ akwụkwọ, nye ha nri nakwa kwụọ ụgwọ ụlọ n'ihi ọrịa.

"Onye nwe ụlọ ezitela ozi sị m kwụọ ya ụgwọ ụlọ nke afọ mana amaghị m ebe m ga-esi nweta ego ahụ."

Gụnyere n'ịzụta ume ọ na-ekwu kwa ụbọchị, ọ na-aṅụkwa ọgwụ ruru mkpụrụ ise kwa ụbọchị nke ụfọdụ n'ime ya ruru N4,000.