Hydroxycholoquine: Ihe ị kwesiri ịma maka etu ọgwụ a si metụta covid-19 - Dkt Ije Akunyili
Dọkịta Ije Akunyili bụ onye na-agwọ ọrịa mberede nke Bekee na-akpọ "Emergency Medicine" na mba Amerịka.
Ọ bụ onye na-elekọta ndị na-arịa coronavirus "n'abalị, n'ụtụtụ nakwa ehihe", dịka o si kwuo.
Dọkịtan Akunyili tinyere ọnụ n'ihe banyere ọgwụ ịba a na-akpọ hydroxychloroquine, Zinc nakwa zithromax, ọkachasị etu ha siri bụrụ ihe ndị eji agwọ covid-19.
Dọkịta Akunyili gbadoro ụkwu n'ala kwusie ike na onwebeghị nchọpụta kwadoro atụmatụ iji hydroxychloroquine gwọọ coronavirus.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na Zinc na Zithromax abụghị ọgwụ a na-aṅụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị ndị dọkịta sị mmadụ ṅụọ ha.
"Nsogbu ha na-enye n'ahu ka ihe a na-erite na ha."
Gee ya ntị ọfụma n'akụkọ a o meere BBC Igbo.

