Etụ gọọmentị Naịjirịa ga-esi họpụta mmadụ 774,000 ha chọrọ iwe n'ọrụ

Ebe foto si, SPW
N'agbanyeghi na ndị omeiwu Naịjirịa sị ka ewezuga mkpebi gọọmenti iwe mmadu 774,000 n'ọrụ site n'atụmatụ akpọrọ "Special Works Programme" (SWP) na Bekee, Osote minista na-ahụ maka ọrụ bụ Festus Keyamo, sị na ọ ga-aga n'ihu.
Keyamo na ngalaba ụlọomeiwu Naịjirịa na-ahụ maka ọrụ nwere nghọtaghie n'ụbọchị Mọnde dika ha na-eme mkparitaụka banyere atụmatụ a.
Ndị omeiwu sị na Keyamo akwanyereghi ha ugwu dịka nzukọ ahụ na-aga n'ihu, ma mechaa sị ya si ebe ahụ ha nọ pụọ.
Keyamo na onwe ya sị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ si na ihe na-ese okwu bụ na ya chọrọ ka a kpaa nkata banyere iwe n'ọrụ a n'ihu ndị ntaakụkọ, mana ndị omeiwu chọrọ ka ọ bụrụ na nzuzo.
Dịka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu, site n'ọnụ onyeisi kọmitii ahụ bụ Muhammadu Alli Wudil, sị na iwe n'ọrụ ahụ kwụsịgodu makana obi akaghị ha etu esiri chọọ ime ya.

Kedụ etu atụmatụ a siri bido?
Dịka webụsaịtị SWP siri kwuo, ọ bụ n'ọnwa Ọktoba nke afọ 2019 ka Onyesiala Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ hibere atụmatụ a.
Gọọmentị sịrị na ọ bụ site n'ụzọ e ji mee ụdịrị ihe a gọọmentị Naịjirịa na otu na-ahụ maka ọdịmma ndị ọrụ na mbaụwa akpọrọ International Labour organisation (ILO).
Ọ bụ n'oge ndị agha na-achị n'ime afọ sonyere 1980 ka e mechara nhazi atụmatụ a, mana ọ bụ ugbua ka gọọmentị sịrị na ọ ga-enye aka n'atụmatụ iwe n'ọrụ ka a malitere iji ya mee ihe.
Gee olu Toby Okechukwu, onyeomeiwu na-anọchite anya Enugu West Federal Constituency gbasara okwu ndị omeiwu na Ministri na-ahụ maka ọrụ
A nwara atụmatụ a na steeti asatọ gụnyere Adamawa, Borno, Ebonyi, Edo, Ekiti, Jigawa, Katsina na Kwara tupu gọọmentị ekwenye ịga n'ihu mee ya ebe niile.

Kedụ etu a ga-eji họpụta ndị a ga-ewe n'ọrụ?
Dịka Keyamo siri kwuo, ọ bụ mmadụ 1000 ka a ga-ahọpụta n'otu ọchịchị ime obodo na Naịjirịa ga-esonye n'atụmatụ a.
Ọ sị na ọ bụ mmadụ 20 n'ime steeti niile ga-ahụ maka ime nhọpụta a.
Kọmitii a niile nwere onyeisi nwee onye ode akwụkwọ.
Dịka ọ kwụ ugbua, ahọpụtala ndị nhọpụta 20. Lee ebe aha ha na akara ekwentị ha dị ebe a.

Kedụ ihe ndị a ga-arụ?
Ọ bụ ọrụ ileta ihe mmepe obodo gụnyere:
- Ọrụ ụzọ dịka ikpocha maọbụ igwu ọwa mmiri nakwa imekwata ụzọ ime obodo.
- Itụziri ụgbọala aka n'okporoụzọ
- Ịzacha ezi
- Ihicha ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ na ihe ndị ọzọ
- A ga-akwụ ndị e were n'ọrụ a puku naịra iri abụọ (N20,000)











